OTÚ Ị GA-ESI NA-ENWE OBI ỤTỌ
Ịghọta Ihe Mere Anyị Ji Dịrị Ndụ
E NWERE ỌTỤTỤ IHE MERE ỤMỤ MMADỤ JI DỊ ICHE N’IHE NDỊ ỌZỌ E KERE EKE. ANYỊ NA-EDE IHE, NA-ESE IHE, NA-EMEPỤTA IHE, NA-ECHEKWA BANYERE AJỤJỤ NDỊ DỊ MKPA NÁ NDỤ, DỊ KA: Gịnị mere eluigwe na ụwa ji dịrị? Olee otú anyị si malite ịdị? Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ? Gịnị ga-eme anyị n’ọdịnihu?
Ụfọdụ ndị anaghị achọ ịjụ ụdị ajụjụ ndị a n’ihi na ha chere na ha agaghị amatali azịza ha. Ndị ọzọ na-ekwu na ọ baghị uru ịjụwa ụdị ajụjụ ndị ahụ n’ihi na ihe niile dị ndụ nọkatara dịrị. Otu nwoke aha ya bụ William Provine, bụ́ ọkachamara n’ihe gbasara akụkọ ihe mere eme na ihe ọmụmụ bayọlọji, kwuru, sị: “O nweghị ihe ọ bụla dị ka chi, o nweghị ihe e kwuru mmadụ kwesịrị iji ndụ ya mee. O nweghị onye nyere iwu gbasara otú mmadụ kwesịrị isi na-akpa àgwà, e nweghị ihe a ga-asị na ọ bụ ya bụ isi ndụ anyị dị.”
Ma, o nwekwara ndị na-ekwetaghị na ọ bụ eziokwu. Ha achọpụtala na e nwere iwu ndị doro anya na-achị ihe ndị e kere eke dị na mbara igwe na n’ụwa. Otú ihe ndị a si maa ezigbo mma na-atụkwa ha n’anya. Ndị mmadụ na-agbalịkwa ilere anya n’ụfọdụ n’ime ha mepụta ihe dị iche iche. Ihe ndị dị ịtụnanya ha na-ahụ kwa ụbọchị na-eme ka ha kweta na o nwere onye nwere amamihe kere ihe ndị ahụ. Ha anọkataghị dịrị.
Echiche a ụfọdụ ndị nwere emeela ka ọtụtụ ndị kweburu na e keghị ihe ndị dị ndụ eke bido ịgbanwe echiche ha. Ka anyị lee ihe mmadụ abụọ n’ime ha kwuru.
DỌKỊTA ỤBỤRỤ AHA YA BỤ ALEXEI MARNOV. “N’ụlọ akwụkwọ ndị m gara, a kụziiri anyị na Chineke adịghị, kụziekwara anyị na e keghị ihe ndị dị ndụ eke. A na-ele onye ọ bụla kweere na Chineke anya ka onye na-amaghị nke a na-akọ.” Ma n’afọ 1990, o bidoro ịgbanwe echiche ya.
O kwuru, sị: “Ọ dịla anya m gbawara mbọ ịghọta ihe mere ihe dị iche iche ji dịrị, ma ụbụrụ mmadụ. E nweela ndị kwuru na ụbụrụ mmadụ dị ezigbo ịtụnanya, bụrụkwa ihe kacha dị mgbagwoju anya ha hụtụrụla. Ihe a ha kwuru dabakwara adaba. Ma, è kere ụbụrụ anyị naanị ka o nyere anyị aka ịmụta ihe, nwee nkà ma mechaa nwụọ? Ọ bụrụ otú ahụ, o nweghịnụ uru ọ bara. M bidoziri ịjụ onwe m, sị: ‘Gịnị mere anyị ji nọrọ n’ụwa a? Gịnị mere anyị ji dịrị ndụ?’ Mgbe m chebachaara ihe ndị a echiche, m gwara onwe m na ọ ga-abụrịrị na e nwere Onye Okike.”
Ịchọ ịmata ihe mere ndụ ji dịrị mere ka Alexei bido ịmụ Baịbụl. Mgbe e mechara, nwunye ya malitere ịmụ Baịbụl. Nwunye ya bụkwa dọkịta, ma, o kweghị na Chineke dị. O bidoro ịmụ Baịbụl ka o nweta ihe ọ ga-eji gosi di ya na Chineke adịghị. Ma ugbu a, Alexei na nwunye ya kwetasiri ike na Chineke dị, ghọtakwa ihe Baịbụl kwuru gbasara ihe mere o ji kee ụmụ mmadụ.
ỌKÀ MMỤTA SAYENSỊ AHA YA BỤ HUABI YIN. Huabi Yin bụ ọkà mmụta n’ihe ọmụmụ fiziks. Ruo ọtụtụ afọ, ọ nọ na-eme nchọnchọ gbasara anyanwụ.
O kwuru, sị: “Mgbe ọ bụla anyị bụ́ ndị sayensị mụrụ banyere ihe ndị e kere eke, anyị na-achọpụtakarị na otú e si hazie ha pụrụ nnọọ iche, nke na-egosi na e nwere iwu ndị na-achị ha. M jụrụ onwe m, sị: ‘Ònye mere iwu ndị ahụ?’ Ọ bụrụ na onye na-esi nri na-akpachara anya ka obere ọkụ o ji esi nri ghara ịkarị akarị ma ọ bụ nyụọ, ònyezi mere iwu ndị na-achị otú okpomọkụ anyanwụ ga-aharu? Ka oge na-aga, m ghọtara na ihe mbụ e kwuru na Baịbụl zara ajụjụ ahụ. Ebe ahụ sịrị: ‘Ná mmalite, Chineke kere eluigwe na ụwa.’ ”—Jenesis 1:1.
O doro anya na sayensị emeela ka anyị mata azịza nke ajụjụ ndị dị ka: Olee otú ụbụrụ anyị si arụ ọrụ? Olee otú anyanwụ si na-ewepụta okpomọkụ na ìhè? Ma, dị ka Alexei na Huabi chọpụtara, Baịbụl zara ajụjụ ndị dị mkpa gbasara ihe mere ihe ndị ahụ ji dịrị, ajụjụ ndị dị ka: Gịnị mere e ji kee eluigwe na ụwa? Gịnị mere e ji nwee iwu ndị na-achị ha? Gịnịkwa mere anyị ji dịrị ndụ?
Baịbụl kwuru gbasara ụwa, sị: ‘Chineke ekeghị ya n’efu, ọ kpụrụ ya ka e biri n’ime ya.’ (Aịzaya 45:18) N’eziokwu, e nwere ihe mere Chineke ji kee ụwa a. Isiokwu na-eso nke a ga-eme ka anyị mata na e nwere ihe jikọrọ ihe mere o ji kee ụwa na olileanya anyị nwere maka ọdịnihu.