Ụdị Mma Kasị Mkpa
Ụdị Mma Kasị Mkpa
NDỊ mmadụ na-enwe mmasị ka ha na ndị ha weere na ha mara mma na-akpa. Ma olee nnọọ ihe ndị na-eme ka ị maa mma? E kwuwerị, e nwere ókè ị pụrụ imeru ihe n’enweghị nsogbu, iji gbanwee ọdịdị i bu pụta ụwa. Ọzọkwa, mma elu ahụ́ anaghị adịte aka, ebe ọ bụ na ọ dịghị onye n’ime anyị taa nke pụrụ ịgbanahụ mmetụta ọjọọ ndị ịka nká na ọrịa na-akpata. È nwere ụdị mma ọzọ ka mkpa, nke na-adịgide adịgide, na nke aka anyị pụrụ iru?
Mkpa Àgwà Ọma Dị
Bible na-emesi anyị obi ike na Onye Okike, bụ́ Jehova Chineke, na-eji àgwà ọma akpọrọ oké ihe. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
Mgbe Jehova gwara Samuel onye amụma ka ọ gaa họpụta otu n’ime ụmụ Jesi ịbụ eze Izrel, onye amụma ahụ bịara nwee mmasị n’ebe nwa okorobịa ọma ahụ bụ́ Elaịab nọ. “N’ezie, ọ nọ n’ihu Jehova, bụ́ onye nke Ya e tere mmanụ,” ka Samuel kwuru. Ma Jehova gwara Samuel, sị: “Elegidela ihu ya anya, elegidekwala ogologo nke ịdị elu ya; n’ihi na ajụwo m ya: n’ihi na Jehova adịghị ahụ dị ka mmadụ si ahụ; n’ihi na mmadụ na-ele ihe anya na-ahụ, ma Jehova na-ele obi.”—1 Samuel 16:6, 7.
Ọ bụ Devid bụ́ nwa ikpeazụ ka e mesịrị họrọ ịbụ eze. Ọ bụ ezie na a sị na ‘anya ya abụọ mara mma’ na “ọ dịkwa mma ile anya,” e nwere ike Devid adịghị adọrọ adọrọ ka ụmụnne ya ndị nwoke tọrọ ya. Ma “mmụọ nke Jehova [dakwasịrị] Devid n’ike site n’ụbọchị ahụ gaa n’ihu.” Ọ bụ ezie na o zughị okè ma mee mmehie ụfọdụ dị oké njọ, a maara Devid nke ọma dị ka onye nwere obi dị mma nakwa dị ka ohu Chineke kwesịrị ntụkwasị obi ruo ọnwụ ya. (1 Samuel 16:12, 13) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na isi ihe mere Chineke ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ bụ àgwà ọma ya.
N’ụzọ dị iche na nke a, tụlee banyere Absalọm, bụ́ otu n’ime ụmụ Devid. O mesịrị bụrụ onye nwere àgwà ọjọọ n’agbanyeghị mma dị egwu ọ mara. Bible na-ekwu banyere ya, sị: “Ma n’Izrel nile ọ dịghị nwoke mara mma dị ka Absalọm a na-eto nke ukwuu: site n’ọbụ ụkwụ ya wee ruo opu n’isi ya ọrụ adịghị n’ahụ́ ya.” (2 Samuel 14:25) Otú ọ dị, oké ọchịchọ Absalọm nwere mere ka o nupụrụ nna ya isi ma weghara ọchịchị ya. Ọbụna o dinara ndị iko nna ya. N’ihi ya, Chineke wesara Absalọm iwe, ọ nwụkwara n’ụzọ dị mwute.—2 Samuel 15:10-14; 16:13-22; 17:14; 18:9, 15.
Ọ̀ dị gị ka gị na Absalọm na-akpa? Mbanụ. N’ezie, a na-agbara ya ọsọ. Mma dị egwu ọ mara emeghị ka e leghara mpako na eguzosighị ike n’ihe ya anya, nke o ji egbochi ọnwụ ya. N’aka nke ọzọ, n’ime Bible e nwere ọtụtụ ihe atụ nke mmadụ ndị nwere amamihe na àgwà ndị na-adọrọ adọrọ, bụ́kwa ndị a na-ekwughị ihe ọ bụla banyere ọdịdị ahụ́ ha. O doro anya na ihe kasị mkpa bụ àgwà ọma ha.
Àgwà Ọma Na-adọrọ Adọrọ
Àgwà ọma ọ̀ pụrụ ime ka ndị ọzọ bụrụ ndị a dọọrọ mmasị ha? Georgina, bụ́ onye ọ fọrọ nke nta ka o ruo afọ iri ọ lụrụ di, na-ekwu, sị: “Kemgbe afọ nile ahụ, enwewo m mmasị dị ukwuu n’ebe di m nọ n’ihi ime ihe n’eziokwu ya na ezi obi o ji emeso m ihe. Ihe kasị mkpa ná ndụ ya bụ ime ihe na-atọ Chineke ụtọ. Nke a emewo ka ọ bụrụ onye na-echebara ndị ọzọ echiche na onye na-ahụ n’anya. Ọ na-ebu ọdịmma m n’uche eme mkpebi, ọ na-emekwa ka m nwee mmetụta nke ịbụ onye e ji kpọrọ ihe. Amaara m na ọ hụrụ m n’anya n’ezie.”
Daniel, bụ́ onye lụrụ nwanyị n’afọ 1987, na-ekwu, sị: “Nwunye m mara mma n’anya m. Ọ bụghị nanị na ọdịdị ya dọtara m n’ebe ọ nọ kamakwa àgwà ya kadị mee ka m hụ ya n’anya. Ọ na-echebakarịrị ndị ọzọ echiche ma na-enwe mmasị n’ime ka obi dị ha mma. O nwere àgwà ọma ndị e ji mara Onye Kraịst. Nke a emewo ka mụ na ya ịnọ na-enye m obi ụtọ.”
N’ụwa a nke na-ele ihe anya elu elu, ọ dị anyị mkpa ileru ihe anya nke ọma. Ọ dị anyị mkpa ịghọta na inweta ọdịdị ahụ́ bụ́ “ịgba” bụ ihe tara akpụ—ma ọ bụrụkwarị na ọ ga-ekwe omume—uru ya anaghịkwa adịte aka. Ma, ịzụlite àgwà ọma bụ ihe kwere omume. Bible na-ekwu, sị: “Amara bụ ụgha, ịma mma bụkwa ihe efu: ma nwanyị nke na-atụ egwu Jehova, nwanyị ahụ ga-enwe otuto.” N’ụzọ dị iche na nke a, Akwụkwọ Nsọ na-adọ aka ná ntị, sị: “Dị ka mgbaaka ọlaedo n’imi ezì, otú a ka nwanyị mara mma nke na-esi n’ezi uche wezụga onwe ya dị.”—Ilu 11:22; 31:30.
Okwu Chineke na-enyere anyị aka iji “mmadụ zoro ezo nke obi n’uwe na-apụghị ire ure bụ́ mmụọ dị jụụ na nke dị nwayọọ, bụ́ nke bara oké uru n’anya Chineke,” kpọrọ oké ihe. (1 Pita 3:4) N’eziokwu, àgwà ọma dị otú ahụ dị nnọọ mkpa karịa mma nkịtị. Ọ bụkwa ihe aka mmadụ nile ga-eru.
[Foto ndị dị na peeji nke 20, 21]
Àgwà ọma pụrụ ime ka ị maa mma karịa ka ihe ọ bụla e ji achọ mma pụrụ ime