Ndị Ntorobịa—Bụ́ Ndị Kwupụtara Ihe Ndị Ha Kweere n’Atụghị Egwu
Ndị Ntorobịa—Bụ́ Ndị Kwupụtara Ihe Ndị Ha Kweere n’Atụghị Egwu
N’ETITI Ndịàmà Jehova, e nwere ọtụtụ ndị na-eto eto. Ha hụrụ Chineke n’anya ma na-agbalịsi ike ibi ndụ kwekọrọ n’ụkpụrụ ya ndị e dekọrọ na Bible. Ndị ntorobịa ndị a ji okpukpe ha akpa nganga, ha na-akọkwara ya ndị ọzọ n’ụlọ akwụkwọ n’atụghị egwu. Tụlee ihe atụ ụfọdụ.
▪ Mgbe Holly nọ na praịmarị nke isii, e nyere ya na ụmụ klas ya ihe omume nke ide edemede banyere ajụjụ bụ́ “Olee otú ị ga-esi akwụsị nsogbu nke iyi ọha egwu n’emeghị ya n’ike?” Holly ji ohere a dee banyere olileanya o nwere maka ọdịnihu bụ́ nke dabeere na Bible. Ọ kọwara na, n’akụkọ ihe mere eme nile, ‘mmadụ enwewo ike n’ahụ́ mmadụ ibe ya imejọ ya.’ (Eklisiastis 8:9) Mgbe ahụ ọ dọọrọ uche gaa na nanị ezi olileanya ihe a kpọrọ mmadụ nwere—Alaeze Chineke. “Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Eze a họpụtara ịchị n’Alaeze ahụ,” ka o dere, “a ga-ekpochapụ nsogbu nile, gụnyere iyi ọha egwu.” Holly kọwara otú Jizọs ga-esi mezuo ihe onye ọchịchị ọ bụla bụ́ mmadụ na-apụghị imezu. “Mgbe ọ nọ n’ụwa,” ka o dere, “Jizọs gosipụtara ụdị onye ọchịchị ọ ga-abụ. Ọ hụrụ ndị mmadụ n’anya ma lekọta ha. O gosipụtara ike o nwere site n’ịgwọ ọrịa na ịkpọlite ndị nwụrụ anwụ n’ọnwụ. Ọ dịghị ọchịchị mmadụ nke nwere ike ime ka ndị nwụrụ anwụ dịghachi ndụ. Ma Alaeze Chineke ga-eme ya.” Holly mechiri edemede ya site n’ịsị, “Ngwọta ya dị n’aka Chineke, ọ dịghị n’aka ụmụ mmadụ.”
N’ala ala nke edemede ahụ, onye nkụzi ya dere, sị: “Chei! Holly, ihe odide a bụ ịgba. I chekwara echiche nke ọma wee dee ya.” Akụkụ Akwụkwọ Nsọ ndị Holly zoro aka na ha masịkwara onye nkụzi ahụ. Nke a nyere Holly ohere nke ịgwa onye nkụzi ya banyere Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke, bụ́ usoro ihe omume nke ikwu okwu na izi ihe nke Ndịàmà Jehova na-enwe kwa izu. Onye nkụzi ya ji obi ụtọ nweta akwụkwọ ọgụgụ ahụ e ji eme ihe n’Ụlọ Akwụkwọ Ije Ozi Ọchịchị Chineke.
▪ Jessica enwewokwa ike
ikwu okwu banyere okwukwe ya n’oge ndị ọ na-ede edemede n’ụlọ akwụkwọ. “Enwewo m ike ide edemede atọ banyere ihe ndị m kweere,” ka ọ na-ekwu. “Otu bụ banyere Ndịàmà Jehova na ihe ndị ruuru okpukpe. Onye nkụzi anyị weere ya dote ebe a ga na-ahụ ya anya n’ọ́bá akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ anyị ka ndị nwere mmasị ịgụ ya wee nwee ike ịgụ ya. Na nso nso a, edere m otu edemede banyere baptizim e mere m na otú ụbọchị ahụ dịruru ná mkpa nye m. Ụmụ akwụkwọ na-adị enyerịta ibe ha akwụkwọ ha ji rụọ ọrụ n’edemede tupu ha edebanyezie ya n’ezigbo akwụkwọ, n’ihi ya, ụmụ klas m nwere ohere nke ịgụ ihe m dere. Otu nwa agbọghọ kwuru, sị: ‘I detara ya. Ọ dị mma ịmara ibu ọrụ ndị ha na ịbụ Onyeàmà Jehova kwụ aga. Ndeewo maka baptizim e mere gị!’ Otu nwata nwanyị ọzọ kwuru, sị: ‘Akụkọ gị amaka! Obi dị m ụtọ na okwukwe gị siri nnọọ ike!’ Otu nwata nwoke dere nnọọ, sị: ‘Isi kpakọrọ gị ọnụ. Ndeewo.’”▪ Mgbe Melissa dị afọ 11, o nwere ohere pụrụ iche nke ikwupụta ihe ndị o kweere. “Nọọsụ nke ụlọ akwụkwọ anyị bịara klas ebe a na-akụziri anyị ihe ọmụmụ sayensị iji kụziere anyị banyere usoro ahụ́ ji alụso ọrịa ọgụ. Okwu banyere mmịnye ọbara bilitere. Mgbe anyị mụsịrị ihe na klas, agwara m onye nkụzi sayensị m banyere otu n’ime vidio anyị bụ́ nke kwuru banyere ọbara. Eji m vidio ahụ bịa akwụkwọ n’ụbọchị na-esonụ, onye nkụzi m jikwa ya laa ma soro ezinụlọ ya kirie ya. N’echi ya, o ji vidio ahụ bịa akwụkwọ ma gosi ya klas abụọ, gụnyere klas nke m. Mgbe ahụ, o kwuru okwu ọma banyere Ndịàmà Jehova, na-agwa klas ahụ na e wezụga anyị, a garaghị enwe ihe ndị e ji edochi anya mmịnye ọbara. Mgbe ọ na-eweghachiri m vidio ahụ, ọ jụrụ, sị, ‘Olee otú m pụrụ isi nweta vidio a maka ọ́bá akwụkwọ nke ụlọ akwụkwọ anyị?’ Enyere m ya otu vidio ahụ. Obi dị ya ụtọ nke ukwuu banyere ya, otú ahụ ka ọ dịkwa m!”
Holly, Jessica, na Melissa so n’ọtụtụ Ndịàmà Jehova na-eto eto bụ́ ndị na-agbaso ndụmọdụ Bible nke bụ́ icheta Onye Okike ha. (Eklisiastis 12:1) Ị̀ na-eme nke ahụ n’onwe gị? Ọ bụrụ otú ahụ, ị pụrụ ijide n’aka na ị na-eme ka obi Jehova ṅụrịa.—Ilu 27:11; Ndị Hibru 6:10.
Mgbe unu bụ́ ndị ntorobịa na-akọrọ ndị nkụzi na ụmụ akwụkwọ ibe unu banyere okwukwe unu, ọ na-agba àmà kpụ ọkụ n’ọnụ banyere Jehova Chineke na nzube ya. Ọ na-emekwa ka okwukwe unu sikwuo ike, na-emekwa ka unu malite iji ihe ùgwù unu nwere nke iso ná ndị ohu Chineke na-akpa nganga. (Jeremaịa 9:24) Ịgba àmà n’ụlọ akwụkwọ na-abụkwa ihe nchebe. Jessica na-akọwa ya n’ụzọ dị otú a, sị: “Otu n’ime uru ndị m na-erite n’ikwupụta ihe ndị m kweere bụ na ụmụ akwụkwọ adịghị anwa ịmanye m ime ihe ndị na-ekwekọghị n’ihe Bible na-ekwu.”
[Foto dị na peeji nke 30]
Holly
[Foto ndị dị na peeji nke 30, 31]
Jessica
[Foto ndị dị na peeji nke 31]
Melissa