Mmanụ Ala—Ọ̀ Na-eweta Ngọzi na Nkọcha?
Mmanụ Ala—Ọ̀ Na-eweta Ngọzi na Nkọcha?
RUO ókè ha aṅaa ka mba ndị mepere emepe na-adabere ná mmanụ ala na ihe ndị e si na ya emepụta? Mmanụ ala dị oké mkpa nye ha, nke a emewokwa ka e nwee “Ọha Mmadụ nke Dabeere na Mmanụ Ala,” dị ka Daniel Yergin kwuru n’akwụkwọ ya bụ́ The Prize. Chegodị echiche banyere mmanụ a na-agbanye n’ígwè e ji eme ka ụlọ kporo ọkụ, mmanụ grease, wax, asphalt, na ihe ndị e ji kemikal e nwetara ná mmanụ ala emepụta—ụgbọelu, ụgbọala, ụgbọ epeepe, gọm, ágbá, ákwà polyester, akpụkpọ ụkwụ, ihe ụmụaka ji egwuri egwu, ihe ndị e ji esiji ákwà, ọgwụ aspirin, ihe na-esi ísì ọma a na-agba n’ahụ́, ihe ntecha, disk e ji akpọ egwu, kọmputa, TV, telifon. Kwa ụbọchị, ọtụtụ mmadụ na-eji ọtụtụ n’ime ihe karịrị 4,000 e si na mmanụ ala mepụta eme ihe, bụ́ ndị na-emetụta ndụ a na-ebi n’oge a n’ụzọ dị ukwuu. Ma gịnị banyere mbibi ọ na-ebibi ụdị ihe dị iche iche dị ndụ, bụ́ nke e jiworo mara mmanụ ala kemgbe ụwa?
Eze nke ‘Na-adịghị Achị nke Ọma’
Ka ọ na-erule ná ngwụsị nke afọ 1940, bụ́ mgbe o yiri ka agha ọ chọọla ịda n’etiti Romania na Hungary, onye ọchịchị aka ike Nazi bụ́ Adolf Hitler gbaara ngwa ngwa gaa kpeziere ha. Ò mere nke ahụ n’ihi obiọma ya? N’ezie, nzube Hitler bụ igbochi olulu mmanụ Romania ịbanye n’aka Soviet Union. Mmanụ bụkwa isi ihe mere Iraq ji wakpoo Kuwait na 1990, nakwa ihe mere mba ndị ọzọ ji bata n’ọgụ ahụ. Ihe atụ ndị a abụtụghị nanị ndị e nwere. Ọtụtụ mgbe, ọchịchọ ụmụ mmadụ na-achọsi ike ka mmanụ ala dịrị ha n’aka akpatawo esemokwu na nhụjuanya.
Ọ bụghị nanị na mmanụ ala dị oké mkpa ná ndụ a na-adị n’oge a kamakwa ọ bụ ihe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike na ndọrọ ndọrọ ọchịchị nakwa ihe mmadụ ole na ole dị ike na-enwe mmasị pụrụ iche na ya. Dị ka Òtù Mba Ndị Na-ebupụ Mmanụ Ala ná Mba Ọzọ (OPEC) si kwuo n’oge na-adịbeghị anya, mmanụ ala abụghị mmanụ nkịtị kama ọ bụ “ihe onwunwe e ji enweta ihe a chọrọ.” Mba dị iche iche ejiriwo mmanụ ala mee ihe iji mesie ibe ha ike site n’itinye mmachibido iwu. Ọzọkwa, olulu mmanụ, ụlọ ọrụ ndị na-esi mmanụ, na ụgbọ mmiri tanker abụrụwo ebe ndị na-eyi ọha egwu lekwasịrị anya—mgbe mgbe, na-ebibi gburugburu ebe obibi n’ụzọ dị egwu.
E bowo ụlọ ọrụ ndị na-egwu mmanụ ebubo na ha so na-emetọ gburugburu ebe obibi site na carbon dioxide na-esi n’ụlọ ọrụ ha abanye n’ikuku, bụ́ nke pụrụ iso na-akpata mgbanwe a na-enwe n’ọnọdụ ihu igwe n’ụwa nile. Dị ka otu akụkọ sitere n’aka ụlọ ọrụ PEMEX (Mmanụ Ala nke Mexico), bụ́ otu n’ime ụlọ ọrụ kasị ukwuu na-egwu mmanụ, gosiri, ihe ndị na-emetọ gburugburu ebe obibi na-apụta ka a na-aga n’usoro dị iche iche nke isi mmanụ ala. Ọ bụ ezie na mmanụ petrol dị ọcha ugbu a karị—ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ isii kemgbe e nwesịrị Nkwekọrịta Kyoto, bụ́ mgbe mba 161 zukọrọ ikwu ihe a ga-eme iji belata iyi egwu nke okpomọkụ a na-enwe n’ụwa nile—ọtụtụ ndị na-eche na ọ dịbeghị ezigbo ihe gbanwerenụ. N’aka nke ọzọ, òtù OPEC na-ekwu na “akụ̀ na ụba na ihe ịga nke ọma [ọtụtụ mba] nwere taa sitere na mmanụ ala.” Ma, ọ̀ na-adị otú ahụ mgbe nile?
Ụfọdụ ndị pụrụ ikwu banyere ihe ndị e mebiworo mgbe a na-egwu mmanụ na mgbe a na-arụ paịpụ mmanụ. Ndị ọzọ pụrụ ikwu banyere ọnụ ọgụgụ na-arịwanye elu nke ndị na-enweghị ọrụ na Saudi Arabia, bụ́ mba kasị nwee mmanụ ala. Alí Rodríguez Araque, bụ́ onyeisi oche nke òtù OPEC, na-ekwu, sị: “Gọọmenti nke mba ndị mepere emepe na-eji àjà ndị ha kwuru ka ndị na-egwu mmanụ, ndị na-esi mmanụ, na ndị na-azụ mmanụ na-achụ, eme ihe n’ụzọ dị ukwuu maka uru nke onwe ha.”
Òtù CorpWatch, nke ọrụ ya bụ ịhụ na òtù dị iche iche zara ajụjụ maka ihe ndị metụtara imebi gburugburu ebe obibi, na-ekwu, sị: “Mmanụ ala ka bụ Eze. Kama ọ dịghị achị nke ọma.”
Gịnị ga-eme mmanụ ala n’ọdịnihu?