OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Kụziere Ha Otú Ha Ga-esi Nọgide Na-efe Jehova
A chọpụtala na ndị nkwusa e bidoro n’oge kụziwere ịdị uchu n’ozi ọma na-emecha bụrụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma. (Ilu 22:6; Fil. 3:16) Ụfọdụ aro ndị dị ebe a nwere ike inyere gị aka ịkụziri onye nkwusa ọhụrụ ihe ndị ga-enyere ya aka ịbụ aka ochie n’ikwusa ozi ọma:
-
Bido kụziwere onye ị na-amụrụ ihe otú e si ezi ozi ọma ozugbo ọ ghọrọ onye nkwusa a na-emebeghị baptizim. (km 8/15 1) Mee ka ọ mata uru ọ bara ịna-apụta ozi ọma kwa izu. (Fil. 1:10) Na-akọ ihe ndị dị mma gbasara ókèala unu. (Fil. 4:8) Gbaa ya ume ka ya na onye nlekọta ìgwè ije ozi ya na ndị nkwusa ndị ọzọ na-arụkọ n’ozi ọma iji nwetakwuo amamihe.—Ilu 1:5; km 10/12 6 ¶3
-
Ọ bụrụ na e mechaa ya baptizim, akwụsịla ịna-agba ya ume nakwa ịkụziri ya otú e si ekwusa ozi ọma, karịchaa ma ọ bụrụ na ọ mụchabeghị akwụkwọ “Ịhụnanya Chineke.”—km 12/13 7
-
Jiri isiokwu ndị dị mfe na-ezi ozi ọma ma gị na onye ọhụrụ soro n’ozi ọma. Jaakwa ya mma ma o zichaa mmadụ ozi ọma. Gwa ya ihe ndị ga-enyere ya aka imekwu nke ọma.—km 5/10 7