Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị

To provide you with the best possible experience, we use cookies and similar technologies. Some cookies are necessary to make our website work and cannot be refused. You can accept or decline the use of additional cookies, which we use only to improve your experience. None of this data will ever be sold or used for marketing. To learn more, read the Global Policy on Use of Cookies and Similar Technologies. You can customize your settings at any time by going to Privacy Settings.

AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | ABỤ ỌMA 45-51

Jehova Agaghị Eleghara Onye Obi Ya Tiwara Etiwa Anya

Jehova Agaghị Eleghara Onye Obi Ya Tiwara Etiwa Anya
Ebe akọnuche Devid na-enye ya nsogbu mgbe Netan ji atụrụ otu nwoke dara ogbenye mechaara ya ihe atụ

Ọ bụ Devid dere Abụ Ọma nke 51. O dere ya mgbe Netan onye amụma tụchara ya mmehie ya n’anya maka iko ya na Bat-shiba kwara. Akọnuche Devid nọ na-ama ya ikpe, ya emechaa wetuo onwe ya ala kwuputa mmehie ya.—2 Sam. 12:1-14.

Devid mere mmehie, ma, ya na Chineke ka ga-adịghachili ná mma

51:3, 4, 8-12, 17

  • Akọnuche ya nọ na-apịa ya ụtarị tupu ya echegharịa ma kwuputa mmehie ya

  • Otú obi si jọọ ya njọ mgbe ahụ ya na Chineke na-adịghị ná mma mere ka ọ dị ya ka è gwepịaala ọkpụkpụ ya

  • Ọ nọ na-atụ anya ka Chineke gbaghara ya, ka ya na ya dịghachi ná mma, ka ọ maliteghachikwa nwewe ọṅụ ọ na-enwe na mbụ

  • O wedara onwe ya ala rịọ Jehova ka o mee ka ya nwee obi ọ ga-eji na-erubere ya isi

  • Obi sikwara ya ike na Jehova ga-agbaghara ya