OTÚ NDỊ KRAỊST SI EBI NDỤ
Ị̀ Na-agbaghara Onwe Gị?
O nwere ike isiri anyị ike ịgbaghara onwe anyị mmehie Jehova gbaghaarala anyị. Ná mgbakọ “Guzosie Ike n’Ebe Jehova Nọ” e nwere n’afọ 2016, e kwuru okwu gbasara ya, gosikwa ya vidio. Jirinụ JW Library unu lee vidio ahụ ọzọ, zaakwanụ ajụjụ ndị a:
-
Afọ ole ka a chụrụ Sonja n’ọgbakọ?
-
Olee amaokwu Baịbụl ndị okenye gụụrụ Sonja, oleekwa otú o si nyere ya aka?
-
Olee otú ụmụnna si mesoo Sonja mgbe a nabataghachiri ya?
-
Olee ihe ndị nọ na-enye Sonja nsogbu n’obi, oleekwa otú papa ya si nyere ya aka?