Abụ nke 18
Ịhụnanya Chineke nke Na-adịgide Adịgide
1. Jaa bụ ịhụnanya!
Nke a n’agb’anyị ume.
O ji ’hụnanya zite
Nwa ya ịgbapụt’anyị,
K’anyị nwet’ezi omume,
Ọṅụ na ndụ ebigh’ebi.
(KORỌS)
Ndị akpịrị n’akpọ nkụ,
Bịa ṅụọ ’miri ndụ n’efu.
Ndị chọrọ, bịanụ ṅụọ;
Hụ obiọma Chineke.
2. Jaa bụ ịhụnanya!
Ọrụ ya gosiri ya.
Ọ hụkwar’anyị n’anya
Nye Jizọs Kraịst och’eze,
K’o mezu’ọgbụgba ndụ ya.
A mụwo Al’eze ya.
(KORỌS)
Ndị akpịrị n’akpọ nkụ,
Bịa ṅụọ ’miri ndụ n’efu.
Ndị chọrọ, bịanụ ṅụọ;
Hụ obiọma Chineke.
3. Jaa bụ ịhụnanya!
K’anyị mụt’ịhụnanya,
Nyere ndị umeala aka
Ịchọt’ụzọ Chineke.
K’anyị n’ezi oziọma,
N’akasi ndị ’madụ obi.
(KORỌS)
Ndị akpịrị n’akpọ nkụ,
Bịa ṅụọ ’miri ndụ n’efu.
Ndị chọrọ, bịanụ ṅụọ;
Hụ obiọma Chineke.