Abụ nke 4
Imere Onwe Anyị Ezi Aha n’Ebe Chineke Nọ
1. A’yị kwesịr’iji Ụbọchị ndụ anyị dum
Nweta ezi aha, Deb’iwu Jaa niile.
Ọ bụrụ na anyị Mee uche Jehova,
A’yị g’eme k’obi Ya ṅụrị’ọṅụ.
2. Ịgbalịs’ike K’a mar’anyị n’ụwa,
Ịbụ enyi ụwa, Na ịch’otuto ya
Bụ naanị ih’efu. Anyị bụr’enyi ya,
Anyị agagh’abụ Enyi nke Jaa.
3. Anyị chọrọ ka Jaa cheta ah’anyị,
Ruo mgb’ebigh’ebi K’ọ dị n’akwụkwọ ya.
Ọ bụ ony’eziokwu, A’yị n’ekwus’Okwu ya,
Ma nwee ezi aha Ruo n’ọgwụgwụ.
(Gụọkwa Jen. 11:4; Ilu 22:1; Mal. 3:16; Mkpu. 20:15.)