Abụ nke 107
Bịa n’Ugwu Jehova
1. Leli’anya, hụ ugwu
Nke kach’ugwu niile.
Ọ bụ Ugwu Jehova.
Ọ dị elu n’oge anyị a.
Ndị si ebe dị anya,
N’akụkụ niile n’ụwa,
N’abịa, n’akpọ ndị ọzọ, sị:
‘Bịanụ fee Chineke.’
Ọ b’ugbu a k’onye nta
G’aghọ mba ukwu Chineke.
Ka anyị n’amụba,
Jaa ga n’edu ma n’agọzi anyị.
Ìgwè ’madụ n’abịa,
Ma n’efe Chinek’anyị.
H’agagh’ahapụ ya.
Ọ bụ nkwa ha kwere ya.
2. Jizọs nyer’any’iwu
Ikwus’okwu Chineke.
A n’ezi ’madụ niile
Ozi ọma Al’eze.
Kraịst nọ n’elu n’achị,
N’asị ndị dum soro ya.
Ndị gere ya ntị
N’eso nduzi Baịbụl.
Ọ n’enye anyị ọṅụ
Ịhụ ok’ìgwè ’madụ n’amụba!
A’yị niile so n’eme
Ka ndị ọzọ mara Jehova.
K’anyị wer’oké olu
N’agwa ’madụ niile, sị,
‘Bịa n’ugwu Jehova,
Nọruo mgb’ebigh’ebi.’
(Gụọkwa Ọma 43:3; 99:9; Aịza. 60:22; Ọrụ 16:5.)