Abụ nke 60
Ọ Ga-eme Ka I Sie Ike
1. Ọ d’ihe mere Jaa ji zi gị eziokwu ya,
Mee k’i si n’ọchịchịrị baa n’ìhè.
Ọ hụrụ na ọ n’agụ gị agụụ n’obi
Ịchọ ya na ime ihe zir’ezi.
I kwere ya nkwa im’uche ya;
Ọ g’anọgide n’enyere gị aka.
(KORỌS)
Chineke ji ọbara Kraịst mee k’ị bụrụ nke ya.
Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.
Ọ g’edu ma chebe gị, dị k’ọ n’eme kemgbe.
Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.
2. Chineke nyere Ọkpara ya n’ihi gị;
Ọ chọrọ k’ihe n’agaziri gị.
Eb’O nyere Ọkpara y’ọ hụrụ n’anya,
K’obi sie g’ike n’ọ g’enye g’ike.
Ọ gaghị echefu okwukwe gị;
Ọ ga n’elekọta ndị ya niile.
(KORỌS)
Chineke ji ọbara Kraịst mee k’ị bụrụ nke ya.
Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.
Ọ g’edu ma chebe gị, dị k’ọ n’eme kemgbe.
Ọ g’eme k’i si’ike, mee k’i guzosi’ike.
(Gụọkwa Rom 8:32; 14:8, 9; Hib. 6:10; 1 Pita 2:9.)