NA-ECHENỤ NCHE!
Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Oké Okpomọkụ Mere n’Ụwa Niile n’Afọ 2023?
N’ebe niile n’ụwa, ụdị okpomọkụ a na-enwetụbeghị ụdị ya na ọdachi ndị ọ na-akpata na-echi ndị mmadụ ọnụ n’ala. Legodị ihe dị iche iche e kwuru gbasara ihe a:
N’abalị 13 n’ọnwa Julaị afọ 2023, otu ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihu ígwé n’Amerịka kwuru, sị: “Kemgbe otu narị afọ na iri asaa na anọ (174) a malitere idekọ otú okpomọkụ si eme n’ụwa, e nwetụbeghị ọnwa Jun kporo ọkụ ka ọnwa Jun afọ a.”
N’abalị 13 n’ọnwa Julaị afọ 2023, ụlọ ọrụ na-ahụ maka ihe gbasara mbara igwe na Yurop kwuru, sị: “Oké okpomọkụ e nwere n’Ịtali, Spen, Frans, Jamanị na Poland enweghị atụ. O ruru nke na a na-atụ anya na okpomọkụ a ga-enwe n’agwaetiti Sisili na Sadinia ga-akarị okpomọkụ niile e nwetụrụla na Yurop.”
N’abalị 17 n’ọnwa Julaị afọ 2023, Stefan Uhlenbrook bụ́ otu n’ime ndị isi n’ụlọ ọrụ Òtù Mba Ụwa nke Na-ahụ Maka Ọnọdụ Ihu Ígwé, kwuru, sị: “Ka ụwa na-ekpokwu ọkụ, o nwere ike ime ka mmiri na-ezosikwu ike ma na-akpakwa ike karịa, kpatazie idei mmiri na-enweghị atụ.”
Otú ụdị akụkọ ndị a si arị elu kwa ụbọchị, ọ̀ na-eme ka ị na-echegbu onwe gị? Chọpụta ihe Baịbụl kwuru gbasara isiokwu a dị mkpa.
Oké okpomọkụ na ọdachi ndị ọzọ yiri ya hà na-emezu amụma Baịbụl?
Ee. Oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa niile na ọdachi ndị ọzọ yiri ya so n’ihe ndị na-emezu amụma Baịbụl buru gbasara ihe ndị ga na-eme n’oge anyị a. Dị ka ihe atụ, Jizọs buru amụma na anyị ga-ahụ “ihe ndị na-atụ egwu” ma ọ bụ “oké ihe àmà dị iche iche.” (Luk 21:11) Oké okpomọkụ a na-enwe n’ụwa niile emeela ka obi koro ọtụtụ ndị n’elu na ụmụ mmadụ ga-emebi ụwa.
È nwere mgbe ụwa a na-agaghịzi adị mma obibi?
Mba. Chineke kere ụwa ka ọ bụrụ ebe anyị ga-ebi ruo mgbe ebighị ebi. Ọ gaghị ekwe ka ndị mmadụ bibie ya. (Abụ Ọma 115:16; Ekliziastis 1:4) O kwedịrị nkwa na ya ‘ga-ebibi ndị na-ebibi ụwa.’—Mkpughe 11:18.
Baịbụl gosiri na Chineke ga-echebeli ụwa ka ọdachi ghara ịla ya n’iyi, ọ ga-echebekwa ya.
“[Chineke] na-eme ka oké ifufe kwụsị ife. Ebili mmiri na-adajụ.” (Abụ Ọma 107:29) Chineke nwere ikike igbochi ihe ndị o kere eke, dị ka anyanwụ na ihe ndị ọzọ, ịkpa ike. Ọ ga-akwụsịli ihe ndị na-akpata oké okpomọkụ na ọdachi ndị ọzọ na-akpa ndị mmadụ aka ọjọọ n’ụwa taa.
“Ị na-elekọta ụwa, na-eme ka ọ na-eme ezigbo nri n’ụba.” (Abụ Ọma 65:9) Chineke ga-agọzi ụwa, ya aghọọ paradaịs.
Ị chọọ ịmatakwu ihe Baịbụl kwuru banyere otú Chineke ga-esi mezie ụwa, gụọ isiokwu bụ́ “Who Will Save the Earth?”