Gaa n'Isiokwu

Gaa n'ebe e dere isiokwu ndị dị na ya

ISIOKWU NDỊ ỌZỌ

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Nkewa

Ihe Baịbụl Kwuru Banyere Ịgba Alụkwaghịm na Nkewa

Jehova chọrọ ka di na nwunye kwesị ntụkwasị obi mgbe niile n’ebe ibe ha nọ. Mgbe Jehova na-ejikọta nwoke mbụ na nwaanyị mbụ, ọ sịrị: ‘Nwoke ga-arapara n’ahụ́ nwunye ya, ha ga-aghọkwa otu anụ ahụ́.’ Jizọs Kraịst mechara kwughachi okwu ahụ ma gbakwụnye, sị: “Ya mere, ihe Chineke kekọtara, mmadụ ọ bụla atọsala ya.” (Jenesis 2:24; Matiu 19:3-6) N’ihi ya, Jehova na Jizọs na-ele alụmdi na nwunye anya dị ka njikọ nke naanị ihe ga-egbubi ya bụ mgbe otu n’ime ha nwụrụ. (1 Ndị Kọrịnt 7:39) Ebe alụmdi na nwunye bụ ihe dị nsọ, e kwesịghị iji ịgba alụkwaghịm eti epele. N’ezie, Jehova kpọrọ ịgba alụkwaghịm nke Akwụkwọ Nsọ na-akwadoghị asị.—Malakaị 2:15, 16.

Olee ihe Akwụkwọ Nsọ kwuru nwere ike ime ka di na nwunye gbaa alụkwaghịm? Jehova kpọrọ ịkwa iko niile asị. (Jenesis 39:9; 2 Samuel 11:26, 27; Abụ Ọma 51:4) N’ezie, otú ọ kpọruru ịkwa iko asị mere ka o kwuo na ọ bụ ihe ga-eme ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. (Ị chọọ ịhụ ebe a kọwara ihe ịkwa iko pụtara, gụọ Isi nke Itoolu, paragraf nke 7.) Jehova kwuru na onye di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko ga-ekpebi ma ya na ya hà ka ga-ebi, ka ọ̀ ga-agba ya alụkwaghịm. (Matiu 19:9) N’ihi ya, ọ bụrụ na o kpebie ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya ahụ kwara iko alụkwaghịm, o meghị ihe Jehova kpọrọ asị. Otú ọ dị, ọgbakọ Ndị Kraịst anaghị agba mmadụ ume ịgba di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. N’ezie, e nwere ihe ndị nwere ike ime ka onye di ya ma ọ bụ nwunye ya kwara iko kpebie na ya agaghị agba ya alụkwaghịm, nke ka nke, ma ọ bụrụ na o ji obi ya dum chegharịa. Mee elu mee ala, ọ bụ ndị ahụ di ha ma ọ bụ nwunye ha kwara iko ga-ekpebi ma hà ga-agba alụkwaghịm. Ha ga-ejikwa isi ha buru ihe ọ bụla si na ya pụta.—Ndị Galeshia 6:5.

N’ọnọdụ ụfọdụ ebe ihe siri oké ike, ụfọdụ Ndị Kraịst ahapụla di ha ma ọ bụ nwunye ha ma ọ bụ gbaa ya alụkwaghịm n’agbanyeghị na onye ahụ akwaghị iko. Mgbe ihe dị otú ahụ mere, Baịbụl kwuru na onye ahụ hapụrụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ‘ga-anọrọ n’alụghị di ma ọ bụ nwunye, ma ọ́ bụghị otú ahụ, ka ha abụọ kpezie.’ (1 Ndị Kọrịnt 7:11) Onye Kraịst ahụ ekwesịghị ịga chọwa onye ọzọ ọ ga-alụ. (Matiu 5:32) Ka anyị leba anya n’ọnọdụ ụfọdụ ebe ihe siri oké ike, nke mere ka ụfọdụ Ndị Kraịst kpebie ịhapụ di ha ma ọ bụ nwunye ha.

Mmadụ ịkpachara anya jụ ilekọta ezinụlọ ya. Ezinụlọ nwere ike ịghọ ogbenye ọnụ ntụ, n’ahụghị tụrụ rachaa, n’ihi na di anaghị egboro ha mkpa ha n’agbanyeghị na o nwere ego. Baịbụl kwuru, sị: ‘Ọ bụrụ na onye ọ bụla adịghị egboro ndị ezinụlọ ya mkpa ha, ọ jụwo okwukwe anyị, jọkarịakwa onye na-ekweghị ekwe ná njọ.’ (1 Timoti 5:8) Ọ bụrụ na nwoke ahụ ekweghị agbanwe, nwunye ya nwere ike ikpebi ma ọ̀ ga-anata akwụkwọ ga-enye ya ikike ịhapụ di ya ma chebe ya na ụmụ ya. N’ezie, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ileru anya ala mgbe e boro Onye Kraịst ebubo na ọ kpachaara anya jụ ilekọta ezinụlọ ya. E nwere ike ịchụpụ onye kpachaara anya jụ ilekọta ezinụlọ ya n’ọgbakọ.

Ịkụtara mmadụ isi aba okpu. Onye na-eme ihe ike nwere ike ịna-akụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe ma mee ka ndụ ya na ọbụna ahụ́ ike ya nọrọ n’ihe ize ndụ. Ọ bụrụ na onye ahụ na-akụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ihe bụ Onye Kraịst, ndị okenye ọgbakọ kwesịrị ịchọpụta ma ọ̀ bụ eziokwu. E nwere ike ikwo iwe ọkụ na ịkụ mmadụ ihe chụpụ mmadụ n’ọgbakọ.—Ndị Galeshia 5:19-21.

Igbochi mmadụ ife Chineke ma otu ma otu. Mmadụ nwere ike na-egbochi di ya ma ọ bụ nwunye ya mgbe niile ife Chineke ma ọ bụ ọbụna si n’ụzọ ụfọdụ na-agbalị ịmanye ya ka o mebie iwu Chineke. Mgbe ụdị ihe ahụ mere, onye ahụ a na-eme otú ahụ ga-ekpebi ma otú ọ ga-esi ‘erubere Chineke isi dị ka onye na-achị achị’ ọ̀ bụ inweta ikike ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya.—Ọrụ 5:29.

N’ọnọdụ ndị a niile anyị kwuru banyere ha, ọ dịghị onye kwesịrị ịgbalị ime ka onye a na-emegbu emegbu kweta ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ma ọ bụkwanụ mee ka o kweta ka ya na ya biri. Ọ bụ ezie na ndị enyi jí ofufe Chineke kpọrọ ihe nakwa ndị okenye nwere ike inye nkwado na ndụmọdụ si na Baịbụl, ha enweghị ike ịmata ihe niile na-eme n’etiti di na nwunye. Ọ bụ naanị Jehova na-ahụ ihe niile na-emenụ. N’ezie, ọ bụrụ na Onye Kraịst etinye nsogbu ezinụlọ ya nnu na ose iji hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya, ọ gaghị abụ ịkwanyere Chineke ma ọ bụ alụmdi na nwunye ùgwù. Jehova ma nkata ọ bụla mmadụ kpara iji hapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya, n’agbanyeghị otú o nwere ike isi gbalịa izochi ya. N’eziokwu, “ihe niile gba ọtọ, gherekwa oghe n’anya onye ahụ anyị ga-aza ajụjụ.” (Ndị Hibru 4:13) Ma ọ bụrụ na ọnọdụ ahụ ajọbiga njọ ókè ruo ogologo oge, ọ dịghị onye kwesịrị ịta Onye Kraịst mechara kpebie ịhapụ di ya ma ọ bụ nwunye ya ụta. Mee elu mee ala, “anyị niile ga-eguzo n’ihu oche ikpe nke Chineke.”—Ndị Rom 14:10-12.