Ekwe Ntị, Tiivi Ma Ọ Bụ Kọmputa Ọ̀ Na-agbazi M Ara?
ISI NKE 36
Ekwe Ntị, Tiivi Ma Ọ Bụ Kọmputa Ọ̀ Na-agbazi M Ara?
“Ide ozi n’ekwe ntị zigara ndị ọzọ na-atọgbu m atọgbu! O nweghị ihe na-atọ m ka ya. I nwere ike ịsị na ọ na-agba m ara.”—Alan.
MGBE ndị mụrụ gị ka na-eto eto, redio na tiivi bụ ihe a kacha eji agbasa ozi. Naanị ihe a na-eji telefon eme bụ ịgwa mmadụ okwu. A na-akwụnyekwa ya n’ahụ́ ájá. Ihe a e kwuru ọ̀ dara gị ka ihe ndị mgbe ochie? Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Ana chere otú ahụ. Ọ sịrị, “Ndị mụrụ m toro mgbe ụwa na-amabeghị nke a na-akọ banyere ihe ndị dị ka ekwe ntị na kọmputa. Ha ka na-amụ ihe ụfọdụ dị n’ekwe ntị ha!”
Taa, i nwere ike iji ekwe ntị ị ga-etinyeli n’akpa uwe gị Ilu 18:13.
kpọọ mmadụ, gere egwú, lee tiivi, gwuo egwuregwu kọmputa, zigara ndị enyi gị ozi iimel, see foto, ma ọ bụdị chọọ ihe n’Ịntanet. Ebe ọ bụ na e nwere kọmputa, ekwe ntị, tiivi, na Ịntanet ugbu a, i nwere ike iche na ịpị ha ma ọ bụ ile ha mgbe niile enweghị ihe o mere. Ma, ndị mụrụ gị nwere ike iche na ihe ndị ahụ na-agbazi gị ara. Ha gwa gị ụdị ihe a, echela na ihe ha na-ekwu enweghị isi. Eze Sọlọmọn, bụ́ nwoke maara ihe, sịrị: “Mgbe onye ọ bụla na-aza okwu tupu ya anụ ya, ọ bụụrụ ya nzuzu.”—Ọ̀ na-eju gị anya na ihe ị na-eme na-echu ndị mụrụ gị ụra? Zaa ajụjụ ndị dị n’okpuru ebe a iji mata ma ekwe ntị, tiivi ma ọ bụ kọmputa ọ̀ na-agbazi gị ara.
Jụọ Onwe Gị, ‘Ọ̀ Na-agbazi M Ara?’
Otu akwụkwọ kwuru na onye ihe na-agba ara “na-emebiga ihe ahụ ókè mgbe niile. Ọ naghị ekwe ya nkwụsị, ọ gaghịkwa achọ ịkwụsị ya n’agbanyeghị nsogbu ọ na-akpatara ya.” N’okpuru ebe a, a kọwara ihe ahụ akwụkwọ ahụ kwuru otu otu. Gụọ ihe ndị na-eto eto ibe gị kwuru, chee ma ì kwutụla ụdị ihe ahụ ma ọ bụ mee ya. Dee ihe i chere bụ́ azịza ajụjụ ndị a jụrụ.
Ọ na-emebiga ya ókè. “Ana m eji ọtụtụ awa egwu egwuregwu kọmputa. Ọ na-echu m ụra, ọ bụ ihe m na-akpụ n’ọnụ mgbe niile. M na-ahapụ ndị ezinụlọ anyị, gaa nọrọ naanị m ma na-egwu egwuregwu kọmputa. Naanị ihe m na-eche bụ ndị ahụ m na-ahụ n’egwuregwu ahụ.”—Andru.
Awa ole ka i chere ihe ndị dị ka ekwe ntị, tiivi, na kọmputa kwesịrị iri gị n’ụbọchị? ․․․․․
Awa ole ka ndị mụrụ gị chere ihe ndị ahụ kwesịrị iri gị? ․․․․․
N’ụbọchị, awa ole ka ị na-eji eme ihe ndị dị ka ide ozi n’ekwe ntị, ile tiivi, itinye foto na ihe ndị ọzọ n’Ịntanet, na igwu egwuregwu kọmputa? ․․․․․
Lee anya n’ihe ndị ị zara. Ì chere na oge i ji eme ihe ndị ahụ karịrị akarị?
□ Ee □ Ee e
Ọ naghị ekwe ya nkwụsị ma ọ bụ ọ naghị achọ ịkwụsị ya. “Ndị mụrụ m na-ahụ ka m na-ede ozi n’ekwe ntị mgbe niile ezigara ndị ọzọ. Ha na-agwa m na m na-emebiga ya ókè. Ma e jiri m tụnyere ndị ọgbọ m, nke m enweghịdị ihe ọ bụ. Ama m na m na-ede ozi n’ekwe ntị karịa ndị mụrụ m. E kwesịghịdị iji m tụnyere ha n’ihi na ha dị afọ iri anọ, ma mụnwa dị afọ iri na ise.”—Alan.
Ndị mụrụ gị ma ọ bụ ndị enyi gị hà agwatụla gị na oge ihe ndị dị ka ekwe ntị, tiivi, na kọmputa na-eri gị karịrị akarị?
□ Ee □ Ee e
Ọ̀ bụ na ị chọghị iselata aka n’awa ole i ji eme ụdị ihe ahụ, ka ọ̀ bụ na iselata aka ekweghị gị omume?
□ Ee □ Ee e
Ọ na-akpatara ya nsogbu. “Ndị enyi m na-ede ozi n’ekwe ntị mgbe niile, ma mgbe ha na-anya ụgbọala. O nwedịrị ike ịta isi ha!”—Julie.
“Mgbe mbụ m nwetara ekwe ntị, m na-apị ya mgbe niile. O nweghị ihe ọzọ m na-arụ. O seere mụ na ndị ezinụlọ anyị na ụfọdụ ndị enyi m okwu. Ma ugbu a, achọpụtala m na mụ na ndị enyi m kparịtawa ụka, ha nọtụ obere ha asị m: ‘Chere ka m zaa ozi a e ziteere m
n’ekwe ntị.’ O so n’ihe mere na mụ na ha anaghịzi akpachi anya.”—Shirley.Ị̀ gụtụla ozi e ziteere gị n’ekwe ntị ma ọ bụ dee ozi n’ekwe ntị zigara mmadụ mgbe ị na-anya ụgbọala, mgbe ị nọ na klas, ma ọ bụ n’ọmụmụ ihe?
□ Ee □ Ee e
Mgbe gị na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị na-akparịta ụka, ị̀ na-asịkarị ha chere ka ị zaa ekwe ntị, ozi iimel, ma ọ bụ ozi e ziteere gị n’ekwe ntị?
□ Ee □ Ee e
Ekwe ntị, tiivi, ma ọ bụ kọmputa ọ̀ na-echu gị ụra ma ọ bụ na-emegharị gị anya mgbe ị na-amụ ihe?
□ Ee □ Ee e
Ị̀ ghọtara na i kwesịrị ịgbanwe? Ọ bụrụ otú ahụ, tụlee aro ndị a.
Ihe Ndị Ga-enyere Gị Aka Ka Ị Ghara Imefe Ya Ókè
Ọ bụrụ na i nwere ihe ndị dị ka ekwe ntị na kọmputa, jụọ onwe gị ajụjụ anọ ndị dị n’okpuru ebe a. I mee ihe e kwuru n’amaokwu Baịbụl ndị a e dere, na ihe ndị ọzọ i kwesịrị ime ma zere ihe ndị ị na-ekwesịghị ime, ọ ga-enyere gị aka ịgbara nsogbu ọsọ, meekwa ka ị ghara imefe ihe ókè.
● Gịnị dị na ya? “Na-echenụ echiche mgbe niile banyere ihe bụ eziokwu, na ihe dị mma, na ihe ziri ezi. . . . na ihe dị ọcha, ihe ọ bụla mabigara mma oke, . . . na nke e kwesịrị inye otuto n’ihi ya.”—Ndị Filipaị 4:8, Baịbụlụ Nsọ nke International Bible Society.
✔ Ihe ị ga-eme: Echefula ndị enyi gị na ndị ezinụlọ unu. Na-akọrọ ha ihe ga-agba ha ume.—Ilu 25:25; Ndị Efesọs 4:29.
X Ihe ị na-agaghị eme: Akọla asịrị, ejila ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa zipụ ozi ma ọ bụ foto rụrụ arụ. Elekwala fim rụrụ arụ.—● Olee mgbe m na-eme ya? “E nwere oge a kara aka maka ihe ọ bụla.”—Ekliziastis 3:1.
✔ Ihe ị ga-eme: Kpebie awa ole ị ga-eji na-ele tiivi, na-egwu egwuregwu kọmputa, na-akpọ mmadụ n’ekwe ntị, zaa onye kpọrọ gị n’ekwe ntị, ma ọ bụ jiri ekwe ntị zipụ ozi ma ọ bụ zaa nke e ziteere gị.
X Ihe ị na-agaghị eme: Ekwela ka ihe ndị dị ka ekwe ntị ma ọ bụ kọmputa megharịa gị anya mgbe gị na ndị ezinụlọ unu ma ọ bụ ndị enyi gị nọ, mgbe ị na-amụ ihe, ma ọ bụ mgbe ị na-eme ihe gbasara ofufe Chineke.—Ndị Efesọs 5:15-17; Ndị Filipaị 2:4.
● Olee ndị mụ na ha na-eme ya? “Unu ekwela ka e duhie unu. Mkpakọrịta ọjọọ na-emebi àgwà ọma.”—✔ Ihe ị ga-eme: Ka ndị gị na ha na-ezirịta ozi n’ihe ndị dị ka ekwe ntị na kọmputa bụrụ ndị ga-enyere gị aka ịkpa àgwà ọma.—Ilu 22:17.
X Ihe ị na-agaghị eme: Aghọgbula onwe gị. Ị ga-amụta ịkpa àgwà ka ndị ị na-elekarị na tiivi, na ndị gị na ha na-akpa ma n’Ịntanet ma n’ekwe ntị. Ị ga-amụtakwa ikwu okwu na iche echiche ka ha.—Ilu 13:20.
● Awa ole ka m ji eme ya? “Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.
✔ Ihe ị ga-eme: Na-ede awa ole ihe ndị dị ka ekwe ntị na kọmputa na-eri gị.
X Ihe ị na-agaghị eme: Ndị enyi gị ma ọ bụ ndị mụrụ gị gwa gị na oge ihe dị ka ekwe ntị na kọmputa na-eri gị karịrị akarị, elegharala okwu ha anya.—Ilu 26:12.
Andru ahụ e dere ihe o kwuru ná mmalite kwuru ihe mere o ji dị mma ka mmadụ ghara imefe ụdị ihe ahụ ókè. Ọ sịrị: “Ihe ndị dị ka ekwe ntị, tiivi, na kọmputa dị mma, ma ha ekwesịghị ịna-eri mmadụ oge. Anaghịzi m ekwe ka ihe ndị ahụ na-eri oge mụ na ndị ezinụlọ anyị na ndị enyi m ji anọkọ.”
GỤKWUO BANYERE ISIOKWU A N’ISI NKE 30 NA NWANNE AKWỤKWỌ A BỤ́ NKE 2
Olee otú ị ga-esi mee ka ndị mụrụ gị kwe ka ị gaa kporie ndụ?
AMAOKWU BAỊBỤL
“Abụla onye maara ihe n’anya onwe gị. Tụọ egwu Jehova, hapụkwa ihe ọjọọ.” —Ilu 3:7.
NDỤMỌDỤ
Ị chọọ iselata aka n’awa ole i ji apị ekwe ntị, mee ka ndị enyi gị mata na ha kpọọ gị, ọ bụghị mgbe niile ka ị ga-aza ozugbo, ma ọ bụ zaa ozi ha ziteere gị n’ekwe ntị ma ọ bụ ozi iimel ha.
Ị̀ MA NA . . . ?
Ị gaa n’Ịntanet taa tinye foto gị ma ọ bụ dee ihe ọ bụla ị na-eme, ma ndị ga-ewe gị n’ọrụ ma ndị ọzọ nwere ike ịhụ ihe ndị ahụ mgbe ọtụtụ afọ gachara.
IHE M GA-EME!
O siere m ike iselata aka n’awa ole m ji ․․․․․, m ga-ekpebi ịna-eji naanị awa ․․․․․ eme ya kwa izu.
Ihe m chọrọ ịjụ papa m ma ọ bụ mama m banyere okwu a bụ ․․․․․
GỊNỊ KA I CHERE?
● Gịnị nwere ike ime ka o siere gị ike ịchọpụta na ihe ndị dị ka ekwe ntị, tiivi, na kọmputa agbawala gị ara?
● Gịnị nwere ike ime ma ọ bụrụ na ị naghị ejide onwe gị n’ụdị ihe ahụ?
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 262]
“Mgbe ile tiivi gbawara m ara, e nwere ọtụtụ ihe m mere iji kwụsị ya. Esiri m ọnwụ selata aka n’awa ole m ji ele ya. Agwara m mama m banyere nsogbu m ugboro ugboro, kpeekwa ekpere ọtụtụ ugboro.”—Kathleen
[Foto dị na peeji nke 263]
Ọ̀ bụ gị na-agwa ekwe ntị gị ihe ọ ga-eme ka ọ̀ bụ ya na-agwa gị ihe ị ga-eme?