Abụ Ọma 115:1-18

115  Ọ bụghị anyị, Jehova, ọ bụghị anyị,+Kama ọ bụ aha gị ka ị ga-enye otuto+Dị ka obiọma* gị si dị, dị ka eziokwu gị si dị.+   Gịnị mere mba dị iche iche ga-eji sị:+“Olee ebe Chineke ha nọ?”+   Ma Chineke anyị nọ n’eluigwe;+O mewo ihe niile masịrị ya.+   Arụsị ha bụ ọlaọcha na ọlaedo,+Ọrụ aka mmadụ.+   Ha nwere ọnụ, ma ha apụghị ikwu okwu;+Ha nwere anya, ma ha apụghị ịhụ ụzọ;+   Ha nwere ntị, ma ha apụghị ịnụ ihe.+Ha nwere imi, ma ha apụghị ịnụ ísì.+   Ha nwere aka, ma ha apụghị imetụ ihe aka.+Ha nwere ụkwụ, ma ha apụghị ịga ije;+Ha adịghị eji akpịrị ha eme mkpọtụ.+   Ndị na-eme ha ga-adị nnọọ ka ha,+Ee, ndị niile tụkwasịrị ha obi.+   Izrel, tụkwasịnụ Jehova obi;+Ọ bụ onye na-enyere ha aka, bụrụkwa ọta ha.+ 10  Ụlọ Erọn, tụkwasịnụ Jehova obi;+Ọ bụ onye na-enyere ha aka, bụrụkwa ọta ha.+ 11  Unu ndị na-atụ egwu Jehova, tụkwasịnụ Jehova obi;+Ọ bụ onye na-enyere ha aka, bụrụkwa ọta ha.+ 12  Jehova echetawo anyị; ọ ga-agọzi anyị,+Ọ ga-agọzi ụlọ Izrel,+Ọ ga-agọzi ụlọ Erọn.+ 13  Ọ ga-agọzi ndị na-atụ egwu Jehova,+Ma ndị nta ma ndị ukwu.+ 14  Jehova ga-eme ka unu baa ụba,+Unu na ụmụ unu.+ 15  Unu bụ ndị Jehova,+Bụ́ Onye kere eluigwe na ụwa, gọziri agọzi.+ 16  Eluigwe bụ eluigwe Jehova,+Ma ụwa ka o nyere ụmụ mmadụ.+ 17  Ndị nwụrụ anwụ adịghị eto Jaa,+Onye ọ bụla nke na-agbada n’ebe ịnọ duu adịghịkwa eto ya.+ 18  Ma anyị onwe anyị ga-agọzi Jaa+Malite ugbu a gaa n’ihu, ruo mgbe ebighị ebi.+Toonụ Jaa!+

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ma ọ bụ, “ịhụnanya na-adịgide adịgide.”