Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Gịnị Mere E Ji Kpọọ Jizọs Ọkpara Chineke?

Ihe Baịbụl kwuru

 A kpọrọ Jizọs “Ọkpara Chineke” ọtụtụ ugboro na Baịbụl. (Jọn 1:49) Okwu ahụ bụ́ “Ọkpara Chineke” na-eme ka a mata na ọ bụ Chineke kere ihe niile, ya bụ, onye nyere ma Jizọs ma ihe niile ndụ. (Abụ Ọma 36:9; Mkpughe 4:11) Baịbụl anaghị akụzi na Chineke mụrụ nwa otú ahụ ndị mmadụ si amụ ụmụ.

 Baịbụl kpọkwara ndị mmụọ ozi “ụmụ ezi Chineke.” (Job 1:6) Baịbụl kwukwara na mmadụ mbụ bụ́ Adam bụ “nwa Chineke.” (Luk 3:38) Ma, ebe ọ bụ na Jizọs bụ onye mbụ Chineke kere nakwa naanị onye o ji aka ya kee, Baịbụl kpọrọ Jizọs Ọkpara Chineke bu ụzọ mụọ.

 Jizọs ọ̀ dịrị ndụ n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa?

 Ee. Jizọs bụ mmụọ ozi Chineke n’eluigwe tupu a mụọ ya n’ụwa ya abụrụ mmadụ. Jizọs kwuru, sị: “Esi m n’eluigwe bịa.”​—Jọn 6:38; 8:23.

 Chineke bu ụzọ kee Jizọs tupu ya ekee ihe ndị ọzọ. Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị:

  •   “Ọ bụ . . . Onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.”​—Ndị Kọlọsi 1:15.

  •   Ọ bụ “mmalite nke ihe Chineke kere.”​—Mkpughe 3:14.

 Jizọs mezuru amụma e buru gbasara “onye malitere n’oge ochie, n’oge a na-amaghị ama gara aga.”​—Maịka 5:2; Matiu 2:​4-6.

 Olee ọrụ Jizọs rụrụ tupu ya abịa n’ụwa?

 O nwere ọkwá dị elu n’eluigwe. Jizọs kwuru gbasara ọkwá ya mgbe ọ nọ na-ekpe ekpere. Ọ sịrị: “Nna, mee ka m nwee ebube . . . bụ́ ebube m nwere n’akụkụ gị mgbe ụwa na-adịbeghị.”​—Jọn 17:5.

 O nyeere Nna ya aka kee ihe ndị ọzọ niile. Jizọs so Chineke rụọ ọrụ “dị ka onye ọkà ọrụ.” (Ilu 8:30) Baịbụl kwuru gbasara Jizọs, sị: “E si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa.”​—Ndị Kọlọsi 1:16.

 Chineke si n’aka Jizọs kee ihe ndị ọzọ niile. Ihe ndị so n’ihe ndị ahụ bụ ma ndị mụọ ozi, ma eluigwe na ụwa. (Mkpughe 5:11) E nwere ike iji otú a Chineke na Jizọs si rụkọọ ọrụ tụnyere otú onye na-ese ụlọ na onye na-arụ ụlọ si arụkọ ọrụ. Ọ na-abụ onye na-ese ụlọ sechaa; onye na-arụ ụlọ ejirizie ihe ahụ o sere rụọ ụlọ.

 Ọ bụ Okwu ahụ. Mgbe Baịbụl na-ekwu gbasara oge Jizọs nọ n’eluigwe tupu ya abịa n’ụwa, ọ kpọrọ Jizọs “Okwu ahụ.” (Jọn 1:1) Okwu ahụ Baịbụl kpọrọ ya gosiri na Chineke si n’aka Ọkpara ya gwa ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ihe ndị ha ga na-eme.

 O nwekwara ike ịbụ na Jizọs rụrụ ọrụ ka Ọnụ Na-ekwuru Chineke n’ebe ụmụ mmadụ nọ. Ebe ọ bụ na Jizọs bụ Okwu Chineke, ọ ga-abụ na o si n’aka Jizọs nye Adam na Iv iwu ahụ o nyere ha n’ogige Iden. (Jenesis 2:​16, 17) Ọ ga-abụkwa na Jizọs bụ mmụọ ozi ahụ chebere ndị Izrel oge ochie mgbe ha nọ n’ala ịkpa, nakwa mmụọ ozi ahụ a gwara ha ka ha rube isi n’ihe o kwuru.​—Ọpụpụ 23:​20-23. *

^ Ọ bụghị naanị Okwu ahụ ka Chineke si n’aka ya gwa ndị mmadụ okwu. Dị ka ihe atụ, o sikwa n’aka ndị mmụọ ozi ndị ọzọ na-abụghị Ọkpara ya nye ụmụ Izrel Iwu ndị o nyere ha.​—Ọrụ Ndịozi 7:53; Ndị Galeshia 3:19; Ndị Hibru 2:​2, 3.