Olee Ndị Bụ Ndị Mmụọ Ozi?
Ihe Baịbụl kwuru
Ndị Mmụọ ozi bụ ndị e kere eke ka ụmụ mmadụ ike. (2 Pita 2:11) Ha bi n’eluigwe, bụ́kwanụ ebe karịrị ụwa anyị a. (1 Ndị Eze 8:27; Jọn 6:38) A na-akpọkwa ha ndị mmụọ.—1 Ndị Eze 22:21; Ọma 18:10.
Olee ebe ndị mmụọ ozi si?
Chineke si n’aka Jizọs kee ndị mmụọ ozi. Baịbụl kpọrọ Jizọs “onye e bu ụzọ mụọ n’ime ihe niile e kere eke.” Baịbụl gwara anyị otù Chineke si jiri Ọkpara ya kee ihe. Ọ sịrị: “N’ihi na e si n’aka ya kee ihe ndị ọzọ niile n’eluigwe na n’elu ụwa, ihe ndị a pụrụ ịhụ anya na ihe ndị a na-apụghị ịhụ anya.” Ndị mmụọ ozi sokwa n’ihe ndị a Jizọs kere. ( Ndị Kọlọsị 1:13-17) Ndị Mmụọ ozi anaghị alụ nwanyị, ha anaghịkwa amụ ụmụ. (Mak 12:25) Kama, e kere “ụmụ ezi Chineke” a otu otu, o nweghị nke mụrụ ibe ya.—Job 1:6.
Ọ dịla anya e kere ndị mmụọ ozi tupu e kee ụwa. Mgbe Chineke kere ụwa, ndị mmụọ ozi “niile malitekwara iti mkpu otuto.”—Job 38:4-7.
Ndị mmụọ ozi hà dị ole?
Baịbụl ekwughị ole ha dị, kama o gosiri na ha dị ọtụtụ. Dị ka ihe atụ, n’ọhụụ e gosiri Jọn onyeozi, e mere ka ọ hụperetụ ọtụtụ narị ijeri ndị mmụọ ozi.—Mkpughe 5:11.
Ndị mmụọ ozi hà nwere aha na àgwà e ji mara ha?
Ee, ha nwere. Na Baịbul, a kpọrọ aha ndị mmụọ ozi abụọ: Maịkel na Gebriel. (Daniel 12:1; Luk 1:26) a Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ kwuru ihe gosiri na ha nwere aha, mana ha ekwughi aha ha.—Jenesis 32:29; Ndị ikpe 13:17, 18.
Ndị mmụọ ozi nwekwara ihe e ji mara ha n’otu n’otu. Ha na ibe ha na-akparịtakwa ụka. (1 Ndị Kọrịnt 13:1) Ha nwere ike iche echiche, nweekwa ike ịrọ abụ iji too chineke. (Luke 2:13, 14) Ha nwekwaara onwe ha ịhọrọ ime ihe ọma ma ọ bụ ihe ọjọọ. Ihe gosiri na nke a bụ eziokwu bụ mgbe ụfọdụ n’ime ha họọrọ iso Setan nupụrụ Chineke isi.—Matiu. 25:41; 2 Pita 2:4.
Ndị mmụọ ozi hà nwere ọkwa dị iche iche?
Ee. Maikel, bụ́ onye isi ndị mmụọ ozi, kacha ndị mmụọ ozi ọzọ niile. (Jud 9; Mkpughe 12:7) Ndị Seraf bụ ndị mmụọ ozi ọzọ ọkwa ha dị elu. Ha na-anọ nso ocheeze Jehova. (Aizaya 6:2, 6) Ndị mmụọ ozi ndị ọzọ e nyere ọrụ pụrụ iche bụ Ndị Cherub. Dị ka ihe atụ, ọ bụ ha chere ụzọ e si aba n’Ogige Iden nche mgbe a chụpụrụ Adam na Iv na ya.—Jenesis 3:23, 24.
Ndị mmụọ ozi hà na-enyere ndị mmadụ aka?
Ee. Chineke na-eji ndị mmụọ ozi ya enyere ndị mmadụ aka taa.
Chineke na-eji ndị mmụọ ozi eduzi ndị ohu ya ikwusa ozi ọma Alaeze ya. (Mkpughe 14:6, 7) Ọrụ a ndị mmụọ ozi na-arụ na-abara ma ndị na-ekwusa ya ma ndị na-anabata ozi ọma ahụ uru.—Ọrụ Ndịozi 8:26, 27.
Ndị mmụọ ozi na-enye aka echebe ọgbakọ Ndị Kraịst ka ndị ọjọọ ghara imerụ ya.—Matiu 13:49.
Ndị mmụọ ozi na-eduzi ndị na-eme uche Chineke, na-echebekwa ha.—Abụ Ọma 34:7; 91:10, 11; Ndị Hibru 1:7, 14.
N’oge na-adịghị anya, ndị mmụọ ozi ga-eso Jizọs lụọ agha iji wepụ ihe ọjọọ n’ụwa a, ma mee ka ụmụ mmadụ nwere onwe ha.—2 Ndị Tesalonaịka 1:6-8.
Onye ọ bụla ò nwere mmụọ ozi na-eche ya nche?
Ọ bụ eziokwu na ndị mmụọ ozi na-enyere ndị na-efe Chineke aka ịhụ na ha nọsiri ike na-eme uche Jehova, ọ pụtaghi na Onye Kraịst ọ bụla nwere mmụọ ozi Chineke dunyere ka ọ na-eche ya nche. b (Matiu 18:10) Ọ bụghị ọnwụnwa ọ bụla ma ọ bụ nsogbu ọ bụla ka ndị mmụọ ozi na-echebe ndị ohu Chineke na ya. Baịbụl gosiri na Chineke “ga-eme ụzọ mgbapụ” ma ọnwụnwa bịa. Otú o si eme ya bụ inye onye ahụ amamihe na ike ọ ga-eji die ya.—1 Ndị Kọrịnt 10:12, 13; Jems 1:2-5.
Ihe na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu gbasara ndị mmụọ ozi
Ụgha: Ndị mmụọ ozi niile dị mma.
Eziokwu: Baịbụl kwuru gbasara “ìgwè ndị mmụọ ọjọọ” nakwa “ndị mmụọ ozi mehiere emehie.” (Ndị Efesọs 6:12; 2 Pita 2:4) Ndị mmụọ ozi ọjọọ a bụ ndị mmụọ ọjọọ, ndị sooro Setan nupụrụ Chineke isi.
Ụgha: Ndị mmụọ ozi anaghị anwụ anwụ.
Eziokwu: A ga-ebibi ndị mmụọ ozi nụpụrụ isi, ha na Setan.—Jud 6.
Ụgha: Ndị mmadụ na-aghọ ndị mmụọ ozi ma ha nwụọ.
Eziokwu: Ndị mmụọ ozi bụ ndị Chineke kere ka ha bụrụ ndị mmụọ ozi, ha abụghị ụmụ mmadụ e si n’ọnwụ kpọlite. (Ndị Kolosị 1:16) Chineke na-eme ka ndị mmadụ a kpọlitere n’ọnwụ ha agaa eluigwe bụrụ ndị na-anaghị anwụ anwụ. (1 Ndị Kọrint 15:53, 54) Ha ga-enweta ọnọdu karịrị nke ndị mmụọ ozi.—1 Ndị Korịnt 6:3.
Ụgha: E kere ndị mmụọ ozi ka ha na-ejere ndị mmadụ ozi.
Eziokwu: Ọ bụ ihe Chineke kwuru ka ndị mmụọ ozi na-eme, ọ bụghị ihe anyị kwuru. (Abụ Ọma 103:20, 21) Jizos n’onwe ya kwudịrị na ya ga-arịọ Chineke maka enyemaka, ọ bughị ndị mmụọ ozi.—Mat. 26:53.
Ụgha: Anyị nwere ike ịrịọ ndị mmụọ ozi n’ekpere ka ha nyere anyị aka.
Eziokwu: Ikpere Chineke ekpere so n’otú anyị si efe ofufe. Ọ bụkwanụ naanị ya ka anyị kwesịrị ife. (Mkpughe 19:10) Ọ bụ naanị Chineke ka anyị kwesịrị ikpere ekpere site n’aha Jizọs.—Jọn 14:6.
a Aha ahụ bụ́ “Lusifa” dị na Baịbụl ụfọdụ n’Aịzaya 14:12. Ọtụtụ ndị chere na ihe a bụ aha mmụọ ozi ahụ mechara ghọọ Setan bụ́ Ekwensu. Ma, okwu Hibru e si sụgharịa Lusifa pụtara “nwa chi ọbụbọ.” Ihe ndị ọzọ e kwuru ebe ahụ gosiri na ọ bụghị Setan ka a na-ekwu okwu ya, kama ọ bụ ndị eze Babịlọn, bụ́ ndị Chineke ga-eweda n’ala n’ihi mpako ha. (Aịzaya 14:4, 13-20) A kpọrọ ndị ọchịchị Babịlọn “nwa chi ọbụbọ” iji kwaa ha emo mgbe a kwatuchara ọchịchị ha
b Ndị ụfọdụ na-ekwu na ihe ahụ Baịbul kọrọ banyere otù e si tọhapụ Pita n’ụlọ mkpọrọ na-egosi na Pita nwere mmụọ ozi na-eche ya nche. (Ọrụ Ndịozi 12:6-16) Ma, mgbe ndị na-eso ụzọ Jizọs kwuru gbasara “mmụọ ozi [Pita],” o nwere ike ịbụ na ha chere na mmụọ ozi nke na-anọchi anya Pita bịara kama Pita ịbịa n’onwe ya.