Ozi Ọma Luk Dere 3:1-38

  • Mgbe Jọn bidoro ozi ya (1, 2)

  • Jọn gwara ndị mmadụ ka ha mee baptizim (3-20)

  • Mgbe Jizọs mere baptizim (21, 22)

  • Usoro ọmụmụ Jizọs Kraịst (23-38)

3  N’afọ nke iri na ise n’ọchịchị Taịbiriọs Siza, oge Pọntiọs Paịlet bụ gọvanọ Judia, Herọd*+ abụrụ onye na-achị Galili, Filip nwanne ya ana-achị Ituria na Trakọnaịtis, Laịsenias ana-achịkwa Abilini,  mgbe Anas bụ otu n’ime ndị isi nchụàjà, Kayafas+ abụrụ nnukwu onye nchụàjà, okwu Chineke ruru Jọn+ nwa Zekaraya ntị n’ala ịkpa.+  O wee na-aga n’obodo niile dị gburugburu Osimiri Jọdan, na-ekwusara ndị mmadụ na ha kwesịrị ime baptizim iji gosi na ha echegharịala ka e wee gbaghara ha mmehie ha,+  dị ka e dere n’akwụkwọ Aịzaya onye amụma, sị: “E nwere onye na-eti mkpu n’ala ịkpa, sị: ‘Kwadebenụ ụzọ Jehova!* Meenụ ka okporo ụzọ ya kwụrụ ọtọ.+  A ga-ekpochi ndagwurugwu niile, meekwa ka ugwu ukwu niile na ugwu nta niile dị larịị. Ụzọ ndị gbagọrọ agbagọ ga-akwụrụ ọtọ, ụzọ ndị na-adịghị larịị adịkwa larịị.  Mmadụ* niile ga-ahụkwa otú Chineke ga-esi zọpụta ndị mmadụ.’”+  Ọ malitere ịgwa ìgwè mmadụ na-abịa ka o mee ha baptizim, sị: “Unu ụmụ ajụala, ònye gwara unu ka unu gbanahụ iwe Chineke na-abịanụ?+  Burunụ ụzọ mịa mkpụrụ gosiri na unu echegharịala. Unu agwakwala onwe unu, sị, ‘Ebreham bụ nna anyị.’ N’ihi na ana m asị unu na Chineke nwere ike isi na nkume ndị a mee ka Ebreham nweta ụmụ.  N’eziokwu, e dowelarị anyụike na mgbọrọgwụ osisi. N’ihi ya, a ga-egbutu osisi ọ bụla na-anaghị amị ezigbo mkpụrụ, tụbakwa ya n’ọkụ.”+ 10  Ìgwè mmadụ ahụ jụrụ ya, sị: “Gịnịzi ka anyị kwesịrị ime?” 11  Ya asị ha: “Onye nwere uwe abụọ, ya chịrị otu chịnye onye na-enweghị. Onye nwere ihe ọ na-eri, ya meekwa otu ihe ahụ.”+ 12  Ndị ọnaụtụ bịakwara ka o mee ha baptizim.+ Ha sịrị ya: “Onye Ozizi, gịnị ka anyị kwesịrị ime?” 13  Ya asị ha: “Unu anala ihe ọ bụla karịrị ego a na-akwụ n’ụtụ isi.”+ 14  Ndị agha jụkwara ya, sị: “Gịnị ka anyị kwesịrị ime?” Ya asịkwa ha: “Unu anarala onye ọ bụla ihe n’ike ma ọ bụ bo onye ọ bụla ebubo ụgha,+ kama ka ihe a na-enye unu* ju unu afọ.” 15  Ebe ọ bụ na ndị Juu nọ na-atụ anya Kraịst, ha niile nọ na-eche n’obi ha banyere Jọn, sị: “Ọ̀ ga-abụ na ọ bụ ya bụ Kraịst?”+ 16  Jọn gwara ha niile, sị: “Mụnwa ji mmiri na-eme unu baptizim. Ma onye ka m ike na-abịa, onye m na-erughị eru ịtọpụ eriri akpụkpọ ụkwụ ya.+ Ọ ga-eji mmụọ nsọ na ọkụ mee unu baptizim.+ 17  O ji shọvel o ji afụcha ihe n’aka iji dowe ebe ọ na-azọcha ọka ezigbo ọcha. Ọ ga-ekpokọtakwa ọka wit n’ụlọ ọ na-akwasa ihe, ma ọ ga-eji ọkụ a na-enweghị ike imenyụ emenyụ gbaa mkpo ya ọkụ.” 18  Ọ gwakwara ha ọtụtụ ihe ndị ọzọ gbara ha ume, na-ezikwa ha ozi ọma. 19  Ma Jọn gwara Herọd onye na-achị Galili gbasara ihe ọjọọ niile ọ na-eme, gwakwa ya na ọ dịghị mma na ọ kpọọrọ Herodias nwunye nwanne ya. 20  N’ihi ya, Herọd mekwuru ihe ọjọọ ọzọ: Ọ kpọchiri Jọn n’ụlọ mkpọrọ.+ 21  Ma mgbe Jọn nọ na-eme ndị ahụ niile baptizim, o mekwara Jizọs baptizim.+ Ka Jizọs nọ na-ekpe ekpere, eluigwe meghere,+ 22  mmụọ nsọ wee bịa n’ụdị nduru bekwasị ya. Otu olu sikwa n’eluigwe kwuo, sị: “Ị bụ Ọkpara m, onye m hụrụ n’anya. Ihe gị masịrị m.”+ 23  Jizọs+ dị ihe dị ka afọ iri atọ+ mgbe o bidoro ozi ya. Dị ka ndị mmadụ chere, ọ bụnwa Josef,+nwa Hilaị, 24  nwa Matat,nwa Livaị,nwa Melkaị,nwa Janaị,nwa Josef, 25  nwa Matatayas,nwa Emọs,nwa Nehọm,nwa Eslaị,nwa Nagaị, 26  nwa Meyat,nwa Matatayas,nwa Semein,nwa Josek,nwa Joda, 27  nwa Joanan,nwa Risa,nwa Zerubabel,+nwa Shieltiel,+nwa Niraị, 28  nwa Melkaị,nwa Adaị,nwa Kosam,nwa Elmedam,nwa Ea, 29  nwa Jizọs,nwa Eliiza,nwa Jorim,nwa Matat,nwa Livaị, 30  nwa Simiọn,nwa Judas,nwa Josef,nwa Jonam,nwa Elayakim, 31  nwa Milia,nwa Mena,nwa Matata,nwa Netan,+nwa Devid,+ 32  nwa Jesi,+nwa Obed,+nwa Boaz,+nwa Salmọn,+nwa Nashọn,+ 33  nwa Aminadab,nwa Anaị,nwa Hezrọn,nwa Pirez,+nwa Juda,+ 34  nwa Jekọb,+nwa Aịzik,+nwa Ebreham,+nwa Tira,+nwa Nehọ,+ 35  nwa Sirọg,+nwa Riu,+nwa Pileg,+nwa Iba,+nwa Shila,+ 36  nwa Kaịnan,nwa Apakshad,+nwa Shem,+nwa Noa,+nwa Lemek,+ 37  nwa Metusela,+nwa Ịnọk,nwa Jered,+nwa Mahalelel,+nwa Kaịnan,+ 38  nwa Ịnọsh,+nwa Set,+nwa Adam,+nwa Chineke.

Ihe E Dere n'Ala Ala Peeji

Ya bụ, Herọd Antipas. Gụọ Nkọwa Okwu.
Gụọ A5.
Na Grik, “Anụ ahụ́.”
Ma ọ bụ “ụgwọ ọnwa unu.”