Gaa n'Isiokwu

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Ihe Baịbụl kwuru

 Chineke nwere ikike ịhụ ihe niile na ime ihe ọ bụla ọ chọrọ n’ebe ọ bụla. (Ilu 15:3; Ndị Hibru 4:13) Ma, Baịbụl anaghị akụzi na Chineke nọ ebe niile ma ọ bụ n’ihe niile. Kama, Baịbụl kwuru na Chineke bụ onye dị adị, nweekwa ebe o bi.

  •   Otú Chineke dị: Chineke bụ mmụọ. (Jọn 4:24) Ụmụ mmadụ enweghị ike ịhụ ya anya. (Jọn 1:18) Na Baịbụl, ndị niile hụrụ Chineke n’ọhụụ kwuru na e nwere otu ebe Chineke nọ. E nwetụghị ebe e kwuru na ọ nọ ebe niile.​—Aịzaya 6:1, 2; Mkpughe 4:2, 3, 8.

  •   Ebe Chineke bi: Chineke bi n’eluigwe, ma ọ bụghị eluigwe nke a anyị na-ahụ anya. Ọ bụ ebe ahụ ka Baịbụl kpọrọ ‘ebe obibi ya n’eluigwe.’ (1 Ndị Eze 8:30) Baịbụl kwuru na e nwere mgbe ndị mmụọ ozi “bịara guzo n’ihu Jehova.” a Nke a gosiri na e nwere ebe Chineke bi.​—Job 1:6.

Ọ bụrụ na Chineke anọghị ebe niile, ọ̀ na-eche gbasara m?

 Ee. Chineke na-eche gbasara anyị niile n’otu n’otu. N’agbanyeghị na Chineke bi n’eluigwe, ọ na ahụ ndị niile na-efe ya n’ụwa, na echebekwa ha. (1 Ndị Eze 8:39; 2 Ihe E Mere 16:9) Ka anyị leba anya n’otú Jehova si egosi na ọ na-eche banyere ndị ji obi ha niile na-efe ya:

  •   Mgbe ị na-ekpe ekpere: Jehova na-anụ ekpere gị ozugbo ahụ ị na-ekpe ya.​—2 Ihe E Mere 18:31.

  •   Mgbe ị dara mba n’obi: “Jehova nọ ndị obi ha tiwara etiwa nso; Ọ na-azọpụtakwa ndị e gburu mmụọ ha.”​—Abụ Ọma 34:18.

  •   Mgbe ị na-amaghị ihe ị ga-eme: Jehova ga-eji Okwu ya bụ Baịbụl mee “ka i nwee nghọta, zikwa gị ụzọ.”​—Abụ Ọma 32:8.

Ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị mmadụ na-ekwu banyere ebe Chineke nọ

 Ụgha: Chineke nọ n’ihe niile o kere eke.

 Eziokwu: Chineke ebighị n’ụwa, o bighịkwanụ n’ebe ọ bụla anyị nwere ike ịhụ anya. (1 Ndị Eze 8:27) Ọ bụ eziokwu na kpakpando na ihe ndị ọzọ Chineke kere “na-akọsa ebube Chineke.” (Abụ Ọma 19:1) Ma, Chineke anaghị ebi n’ihe ndị o kere eke, otú ahụ onye na-ese ihe na-enweghị ike ibi n’ime ihe o sere ese.  Ma ihe e sere ese nwere ike ime ka a mata ihe ụfọdụ gbasara onye sere ya. Ọ bụkwa otú ahụ ka ihe ndị Chineke kere eke na-eme ka a mata “àgwà ya ndị a na-apụghị ịhụ anya,” ndị dị ka ike ya, amamihe ya, na ịhụnanya ya.​—Ndị Rom 1:20.

 Ụgha: Ọ ga-abụrịrị na Chineke nọ ebe niile tupu ya enwee ike ịma ihe niile, bụrụkwa onye kacha ike.

 Eziokwu: Mmụọ nsọ bụ ike Chineke nọ n’ọrụ. Chineke na-eji mmụọ nsọ ya eme ihe ọ bula ọ chọrọ, n’ebe ọ bụla ọ chọrọ, na mgbe ọ bụla ọ chọrọ, n’anọghịdị ebe ahụ.​—Abụ Ọma 139:7.

 Ụgha: Ihe Abụ Ọma 139:8 kwuru gosiri na Chineke nọ ebe niile. Ebe ahụ sịrị: “Ọ bụrụ na mụ agbagoo n’eluigwe, ị ga-anọ n’ebe ahụ; Ọ bụrụkwa na mụ agbasaa ihe ndina m na Shiol, lee! ị ga-anọ n’ebe ahụ.”

 Eziokwu: Amaokwu Baịbụl a anaghị ekwu gbasara ebe Chineke nọ. Ihe ebe ahụ na-akọwa bụ na o nweghị ebe anyị ga-anọ, ya adịrị Chineke anya ichebe anyị.

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.