Gaa n'Isiokwu

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Chineke Ọ̀ Nọ Ebe Niile?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba. Chineke bi n’eluigwe. Legodị ihe ụfọdụ Baịbụl kwuru:

 Mgbe Eze Sọlọmọn na-ekpegara Chineke ekpere, ọ gwara ya sị: “Nọrọ n’eluigwe, bụ́ ebe obibi gị guzosiri ike, nụrụ.”—1 Ndị Eze 8:43.

 Jizọs Kraịst gwara ndị na-eso ụzọ ya na onye ha ga na-ekpegara ekpere bụ “Nna anyị nke bi n’eluigwe.”Matiu 6:9.

 Mgbe a kpọlitere Jizọs n’ọnwụ, “ọ banyere n’ime eluigwe, ka o wee pụta ugbu a n’ihu Chineke.”—Ndị Hibru 9:24.

 Amaokwu Baịbụl ndị a gosiri na ọ bụ naanị n’eluigwe ka Chineke nọ. Ma, ọ na-ahụ ihe niile na-eme n’ụwa.