Gaa n'Isiokwu

Gịnị Mere Unu Ji Aza Ndịàmà Jehova?

Gịnị Mere Unu Ji Aza Ndịàmà Jehova?

 Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova. (Ọpụpụ 6:3; Abụ Ọma 83:18) Onyeàmà bụ onye na-agwa ndị mmadụ ihe bụ́ eziokwu banyere onye ọzọ.

 N’ihi ya, ihe mere anyị ji na-aza Ndịàmà Jehova bụ maka na anyị bụ Ndị Kraịst, ndị na-agwa ndị mmadụ eziokwu banyere Jehova, onye kere ihe niile. (Mkpughe 4:11) Anyị na-agbara Jehova àmà mgbe ndị ọzọ na-ahụ otú anyị si ebi ndụ dị mma, nakwa mgbe anyị na-akọrọ ha ihe ndị anyị mụtara na Baịbụl.—Aịzaya 43:10-12; 1 Pita 2:12