Gaa n'Isiokwu

Olee Ebe Ekwensu Bi?

Olee Ebe Ekwensu Bi?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ekwensu bụ mmụọ. N’ihi ya, o bi n’ebe a na-adịghị ahụ anya. Ma, ọ pụtaghị na ọ nọ n’ọkụ ala mmụọ na-ata ndị mmehie ahụhụ, otú a e sere n’aka nri ebe a.

Agha a lụrụ n’eluigwe

 O nwere mgbe Setan bụ́ Ekwensu nweere onwe ya ịna-akpagharị n’eluigwe, nwerekwa onwe ya iso ndị mmụọ ozi ndị ọzọ bịa n’ihu Chineke. (Job 1:6) Ma, Baịbụl kwuru na a ga-alụ ‘agha n’eluigwe’ ma chụpụ Ekwensu, ‘chụda ya n’ụwa.’ (Mkpughe 12:7-9) Ihe e kwuru na Baịbụl na ihe ndị na-eme n’ụwa gosiri na a lụọla agha ahụ. Ekwensu nọzi n’ụwa ugbu a, o nweghịkwa ike ịlaghachi eluigwe.

 Ma, ọ̀ pụtara na e nwere otu ebe Ekwensu bi n’ụwa a? Baịbụl kwuru na obodo Pagamọm oge ochie bụ “ebe ocheeze Setan dị” nakwa “ebe Setan bi.” (Mkpughe 2:13) Ma, ọ ga-abụ na ihe ebe ahụ na-ekwu bụ na obodo ahụ bụ ebe ofufe Ekwensu gbanyere mgbọrọgwụ. Baịbụl kwuru na Ekwensu na-achị “alaeze niile nke elu ụwa mmadụ bi.” N’ihi ya, o nweghị otu ebe o bi, kama, a chụdatara ya n’ụwa.​—Luk 4:​5, 6.