Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Ụwa?

Ọ̀ Bụ Chineke Na-akpata Nsogbu Ụwa?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl kwuru hoo haa na ọ bụghị Chineke. O nweghị mgbe Jehova Chineke chọrọ ka ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ma, mmadụ abụọ mbụ Chineke kere nupụụrụ Chineke isi, nke gosiri na ha achọghị ka Chineke na-achị ha. Ha kpebiri iji aka ha na-agwa onwe ha ihe dị mma na ihe dị njọ. Ebe ha jụrụ Chineke, nsogbu bịara zuo ha ahụ́.

 Ọ bụ ihe ahụ ha mere na-akpatakwara anyịnwa nsogbu taa. N’ihi ya, anyị ekwesịghị ịsị na ọ bụ Chineke mere anyị ji na-ata ahụhụ.

 Baịbụl kwuru, sị: “N’oge ọnwụnwa, ka onye ọ bụla ghara ịsị: ‘Ọ bụ Chineke na-anwa m.’ N’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Nsogbu nwere ike ịbịara onye ọ bụla, ma onye ezi omume ma onye ajọ omume.