Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Mmanya Na-aba n’Anya? Ịṅụ Ya Ọ̀ Bụ Mmehie?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Banyere Mmanya Na-aba n’Anya? Ịṅụ Ya Ọ̀ Bụ Mmehie?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mmadụ ịṅụ mmanya na-aba n’anya abụghị ihe ọjọọ. Baịbụl kwuru na mmanya bụ onyinye sí n’aka Chineke nke na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. (Abụ Ọma 104:14, 15; Ekliziastis 3:​13; 9:7) O kwukwara na mmanya nwere ike ịgwọ ọrịa ụfọdụ.​—1 Timoti 5:​23.

 Jizọs ṅụrụ mmanya mgbe ọ nọ n’ụwa. (Matiu 26:29; Luk 7:​34) Otu n’ime ọrụ ebube ndị a ma ama Jizọs rụrụ bụ ime ka mmiri ghọọ mmanya mgbe ọ gara agbamakwụkwọ.​—Jọn 2:​1-​10.

Nsogbu ịṅụbiga mmanya ókè na-akpata

 N’agbanyeghị na Baịbụl kwuru na ịṅụ mmanya abụghị ihe ọjọọ, o kwuru na anyị ekwesịghị ịṅụ oké mmanya ma ọ bụ ṅụbiga mmanya ókè. N’ihi ya, Onye Kraịst ọ bụla chọrọ ịṅụ mmanya na-aba n’anya ekwesịghị ịṅụbiga ya ókè. (1 Timoti 3:8; Taịtọs 2:​2, 3) Baịbụl kwuru ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji ghara ịna-aṅụbiga mmanya ókè.

  •   Ọ na-eme ka mmadụ ghara iche echiche nke ọma nakwa ka isi ghara ịkpakọ onye ahụ ọnụ. (Ilu 23:29-​35) Onye mmanya na-egbu agaghị erubeli isi n’iwu a Baịbụl nyere anyị. Ọ sịrị: ‘Nyefeenụ Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.’​—Ndị Rom 12:1.

  •   Ịṅụbiga mmanya ókè na-eme ka mmadụ ghara ịna-ejide onwe ya. Ọ ‘na-anapụkwa ezi uche.’​—Hosia 4:​11; Ndị Efesọs 5:​18.

  •   O nwere ike ime ka mmadụ daa ogbenye, kpatakwara onye ahụ ọrịa ọjọọ.​—Ilu 23:21, 31, 32.

  •   Chineke kpọrọ ịṅụ oké mmanya na ịnụbiga mmanya ókè asị.​—Ilu 23:20; Ndị Galeshia 5:​19-​21.

Iko ole ka mmadụ ga-aṅụ ya abụrụ na ọ ṅụọla oké mmanya?

 Ọ bụrụ na mmanya mmadụ na-aṅụ na-akpatara ma yanwa ma ndị ọzọ nsogbu, onye ahụ na-aṅụ oké mmanya. Ihe Baịbụl kwuru e ji amata na mmadụ aṅụbigala mmanya ókè abụghị na onye ahụ tụbọrọ atụbọ, kama ọ bụ na uche anaghị akpakọ onye ahụ ọnụ, ya ana-adagharị adagharị, na-arụ ụka na-enweghị isi ma na-ekwugheri ekwugheri. (Job 12:25; Abụ Ọma 107:27; Ilu 23:29, 30, 33) Ndị na-agbadị mbọ ka mmanya ghara igbu ha nwedịrị ike ịṅụ oké mmanya, ma taa ahụhụ ọ na-akpata.​—Luk 21:34, 35.

Mgbe mmadụ na-ekwesịghị idetụ mmanya ọnụ

 Baịbụl kwuru ihe ụfọdụ nwere ike ime ka Onye Kraịst ghara ịṅụ mmanya na-aba n’anya:

  •   Ọ bụrụ na ọ ga-eme ka ndị ọzọ sụọ ngọngọ.​—Ndị Rom 14:21.

  •   Ọ bụrụ na iwu obodo machibidoro ịṅụ mmanya na-aba n’anya.​—Ndị Rom 13:1.

  •   Ọ bụrụ na mmadụ anaghị ejideli onwe ya ka ọ ghara ịṅụbiga mmanya ókè. Ndị aṅụrụma na ndị ọzọ mmanya na-aba n’anya na-akpatara nsogbu kwesịrị ịgbasi mbọ ike ka ha nwee ike ịkwụsị ịna-aṅụ ya.​—Matiu 5:​29, 30.