Gaa n'Isiokwu

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Igbu Egbugbu?

Gịnị Ka Baịbụl Kwuru Gbasara Igbu Egbugbu?

Ihe Baịbụl kwuru

 E kwuru gbasara igbu egbugbu naanị otu ugboro na Baịbụl. Ọ bụ na Levitikọs 19:28. Ebe ahụ sịrị: “Unu egbukwala egbugbu n’ahụ́ unu.” Chineke nyere mba Izrel iwu a iji mee ka ha dị iche n’ebe mba ndị ọzọ gbara ha gburugburu nọ. Ndị obodo ndị a gbara ha gburugburu na-ede aha chi ha ma ọ bụ see chi ha n’ahụ́ ha. (Diuterọnọmi 14:2) Ọ bụ eziokwu na ọ bụghị Ndị Kraịst ka e nyere iwu ahụ, ma anyị kwesịrị iche echiche nke ọma mata ihe mere e ji nye ya ụmụ Izrel.

Onye Kraịst ò kwesịrị igbu egbugbu n’ahụ́ ya?

 Amaokwu Baịbụl ndị e dere n’okpuru ebe a ga-enyere gị aka ịma ihe ị ga-eme:

  •   “Ka ụmụnwaanyị were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, otu na-egosi imeru ihe n’oke.” (1 Timoti 2:9, Baịbụl Nsọ: Nhazi Katọlik) Ihe a Baịbụl kwuru gbasakwara ụmụ nwoke. Anyị ekwesịghị ime ihe ga-akpasu ndị ọzọ iwe, ma ọ bụkwanụ mee ihe ga-eme ka ọ bụrụ anyị ka ndị mmadụ ga na-ele.

  •   Ụfọdụ ndị na-egbu egbugbu ka e jiri ya mara ha ma ọ bụ ka ha gosi na ha eruola ime ihe ọ bụla masịrị ha. Ndị ọzọ na-egbukwa egbugbu iji gosi na ọ bụ hanwa nwe ahụ́ ha. Ma, Baịbụl na-agwa Ndị Kraịst, sị: “Unu nyefee Chineke ahụ́ unu dị ka àjà dị ndụ, dị nsọ, nke dị Chineke mma, ya bụ, ozi dị nsọ site n’ike iche echiche unu.” (Ndị Rom 12:1) Jiri “ike iche echiche” gị mara ihe mere i ji chọọ igbu egbugbu. Ọ bụrụ na ihe mere i ji chọọ ime ya bụ na ị hụrụ na ndị ọzọ na-eme ya ma ọ bụkwanụ na ị chọrọ iji ya gosi òtù ị nọ na ya, cheta na i nwere ike ịgbanwe obi gị echi, mana egbugbu ahụ agaghịzi ekwe nhichapụ. Ọ bụrụ na i chebara ihe mere i ji chọọ igbu egbugbu echiche nke ọma, ọ ga-enyere gị aka ịma ihe kacha mma ị ga-eme.—Ilu 4:7.

  •   “Atụmatụ onye dị uchu aghaghị iweta uru, ma onye ọ bụla ọ na-adị ngwa ngwa aghaghị ịdaba n’ụkọ.” (Ilu 21:5) Ọtụtụ ndị na-egbu egbugbu anaghị eche echiche nke ọma tupu ha emewe ya. Ma, o nwere ike imebi mmekọrịta ha na ndị ọzọ ma ọ bụ kpatara ha nsogbu n’ebe ọrụ ha. Nsogbu ndị ahụ na-adịtekwa aka. Ọ na-efu ezigbo ego ihichapụ egbugbu, ọ na-afụkwa ezigbo ụfụ. Nchọpụta e mere na-egosi na ọtụtụ ndị gburu egbugbu na-emecha chọwa iwepụ ya. Otú ndị mmadụ si ekwo ekwo n’ebe ndị a na-ewepụ egbugbu gosikwara na ọ bụ eziokwu.