Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Kagburu Ịgba Alụkwaghịm?

Baịbụl Ọ̀ Kagburu Ịgba Alụkwaghịm?

Ihe Baịbụl Kwuru

 Baịbụl akagbughị ịgba alụkwaghịm. Ma, Jizọs kwuru na ọ bụ naanị otu ihe nwere ike ime ka mmadụ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. Ọ sịrị: “Onye ọ bụla nke gbara nwunye ya alụkwaghịm, ma e wezụga n’ihi ịkwa iko, wee lụọ nwunye ọzọ, na-akwa iko.”—Matiu 19:9.

 Chineke achọghị ka mmadụ jiri aghụghọ gbaa di ya ma ọ bụ nwunye ya alụkwaghịm. Onye ọ bụla mere ụdị ihe a ga-aza Chineke ajụjụ, nke ka nke, ma ọ bụrụ na ihe onye ahụ kwo mee ya bụ ka ọ gaa lụrụ onye ọzọ.—Malakaị 2:13-16; Mak 10:9.