Gaa n'Isiokwu

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Iji Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ihe Ọ Bụla Ọzọ Gbochie Afọ Ime?

Ndị Kraịst Hà Kwesịrị Iji Ọgwụ Ma Ọ Bụ Ihe Ọ Bụla Ọzọ Gbochie Afọ Ime?

Ihe Baịbụl kwuru

 Jizọs agwaghị ndị na-eso ụzọ ya mụọ ụmụ ma ọ bụ amụla ụmụ. O nweghịkwa onye na-eso ụzọ Jizọs nyere ụdị iwu ahụ. O nweghị ebe Baịbụl kwuru hoo haa na igbochi afọ ime bụ ihe ọjọọ. Ihe onye ọ bụla kwesịrị iburu n’obi n’okwu a bụ ihe e dere ná Ndị Rom 14:12. Ebe ahụ sị: “Onye ọ bụla n’ime anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka onwe ya.”

 Ọ bụ di na nwunye ga-ekpebi ma hà ga-amụ ụmụ ma ọ bụ na ha agaghị amụ. Ọ bụkwa hanwa ga-ekpebi ụmụ ole ha ga-amụ na mgbe ha ga-amụ ha. Ọ bụrụ na di na nwunye ekpebie iji ọgwụ ma ọ bụ ihe ọ bụla ọzọ gbochie afọ ime, o nweghị onye kwesịrị ịkatọ ha. Ya na ite ime abụghị otu.—Ndị Rom 14:4, 10-13.