Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Kwuru na Ile Ndị Gba Ọtọ Dị Njọ? Ịnọ n’Ịntanet Na-ekwu Gbasara Mmekọahụ Ọ̀ Dị Njọ?

Baịbụl Ò Kwuru na Ile Ndị Gba Ọtọ Dị Njọ? Ịnọ n’Ịntanet Na-ekwu Gbasara Mmekọahụ Ọ̀ Dị Njọ?

Ihe Baịbụl kwuru

 Baịbụl akpọghị ile ndị gba ọtọ ma ọ bụ ịnọ n’Ịntanet na-ekwu gbasara mmekọahụ aha. Ma, Baịbụl kwuru họọ haa otú Chineke si ele ihe ndị nwere ike ime ka mmadụ kwaa iko anya. Lee ihe amaokwu Baịbụl ndị a kwuru:

  •   “Meenụ ka akụkụ ahụ́ unu ndị dị n’elu ụwa nwụọ n’ihe banyere ịkwa iko, adịghị ọcha, agụụ mmekọahụ.” (Ndị Kọlọsi 3:5) Ile ndị gba ọtọ anaghị eme ka agụụ ihe ọjọọ ghara ịna-agụ mmadụ, kama, ọ na-eme ka ọ na-agụsikwu mmadụ ike. Ọ na-emekwa ka mmadụ ghara ịdị ọcha n’anya Chineke.

  •   “Onye ọ bụla nke na-ele nwaanyị anya, o wee gụọ ya agụụ ka ya na ya nwee mmekọahụ, ọ kwasowo ya iko n’obi ya.” (Matiu 5:​28) Ile ndị na-akwa iko ga-eme ka i chewe ihe ọjọọ nke ga-eme ka i mee ihe na-adịghị mma.

  •   “Ka a ghara ịkpọtụdị ịkwa iko na ụdị adịghị ọcha ọ bụla ma ọ bụ anyaukwu aha n’etiti unu.” (Ndị Efesọs 5:3) Anyị ekwesịghị iji ihe gbasara mmekọahụ na-ama njakịrị ma ya fọdụzie ile ya ele ma ọ bụ ịgụ akwụkwọ gbasara ya.

  •   “Ọrụ nke anụ ahụ́ pụtara ìhè, ha bụ ịkwa iko, adịghị ọcha, . . . na ihe ndị dị otú a. Ebu m ụzọ na-adọ unu aka ná ntị banyere ihe ndị a, n’otu ụzọ ahụ m buru ụzọ dọọ unu aka ná ntị, na ndị na-eme ihe ndị dị otú ahụ agaghị eketa alaeze Chineke.” (Ndị Galeshia 5:​19-​21) Chineke weere ndị na-ekiri ndị gba ọtọ ka ndị na-adịghị ọcha, ya bụ, ndị àgwà ha rụrụ arụ. Ndị ọzọ o weere otú ahụ bụ ndị na-anọ n’Ịntanet ekwurịta banyere mmekọahụ, ndị na-eji ekwentị eme nke ha, nakwa ndị na-eji ekwentị ezigara ndị ọzọ foto ndị gba ọtọ. Ọ bụrụ na anyị ana-eme ihe ndị a, anyị na Chineke agaghị adị ná mma.