Gaa n'Isiokwu

Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?

Chineke Ọ̀ Ga-agbaghara M?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ee, Chineke ga-agbaghara gị ma i mee ihe ndị i kwesịrị ime. Baịbụl kwuru na Chineke ‘dị njikere ịgbaghara mmehie’ nakwa na ọ ‘ga-agbaghara anyị mmehie n’ụzọ dị ukwuu.’ (Nehemaya 9:17; Abụ Ọma 86:5; Aịzaya 55:7) Ọ na-agbaghara mmehie anyị kpamkpam. Ọ na-ehichapụ mmehie anyị. (Ọrụ Ndịozi 3:​19) Chineke agaghịkwa echeta mmehie anyị n’ihi na o kwuru, sị: “Agakwaghị m echeta mmehie ha.” (Jeremaya 31:34) Ọ gbaghara anyị, ọ naghịzi echeta mmehie anyị mere n’oge gara aga ka o nwee ike ịta anyị ahụhụ ugboro ugboro ma ọ bụ kwuo na anyị bụ ndị ọjọọ.

 Ma, ihe mere Chineke ji agbaghara anyị abụghị maka na Chineke adịghị ike ma ọ bụ na ọ na-ele anyị anya n’ihu. Ọ naghị agbanwe iwu ya. Ọ bụ ya mere na ọ naghị agbaghara ụfọdụ ihe ndị mmadụ na-emejọ.​—Jọshụa 24:19, 20.

Ihe ị ga-eme ka Chineke gbaghara gị

  1.   Kweta na i mehiere megide Chineke. N’agbanyeghị na e nwere ike inwe ndị ihe i mere na-ewute, i kwesịrị ibu ụzọ ghọta na onye ọ bụla mehiere bụ Chineke ka o mejọrọ.​—Abụ Ọma 51:1, 4; Ọrụ Ndịozi 24:16.

  2.   Kwupụtara Chineke mmehie gị n’ekpere.​—Abụ Ọma 32:5; 1 Jọn 1:9.

  3.   Ihe i mere kwesịrị iwute gị nke ukwuu. Ọ bụrụ na mmadụ enwee “mwute dị ka uche Chineke si dị,” ọ ga-eme ka onye ahụ chegharịa. (2 Ndị Kọrịnt 7:​10) Ọ pụtakwara ịkwa ụta banyere ihe mere i ji mee mmehie ahụ.​—Matiu 5:​27, 28.

  4.   ‘Chigharịa,’ ya bụ, gbanwee otú i si akpa àgwà. (Ọrụ Ndịozi 3:​19) O nwere ike ịpụta ịkwụsị ihe ọjọọ ahụ ị na-eme ma ọ bụkwanụ ịgbanwe otú i si eche echiche na otú i si akpa àgwà.​—Ndị Efesọs 4:​23, 24.

  5.   Gbaa mbọ mezie ihe ị na-emetaghị. (Matiu 5:23, 24; 2 Ndị Kọrịnt 7:​11) Rịọ ndị i mejọrọ ma ọ bụ ndị ihe i mere wutere mgbaghara, gbalịakwa mezie ihe ndị i nwere ike imezi.​—Luk 19:​7-​10.

  6.   Rịọ Chineke ka ọ gbaghara gị n’ihi àjà Jizọs chụrụ. (Ndị Efesọs 1:7) Ị chọọ ka Chineke za ekpere gị, i kwesịrị ịgbaghara ndị mejọrọ gị.​—Matiu 6:​14, 15.

  7.   Ọ bụrụ na i mere mmehie dị́ oké njọ, gwa ya onye ruru eru ga-eji Baịbụl nyere gị aka, onye rukwara eru ikpere gị ekpere.​—Jems 5:​14-​16.

Ihe na-abụghị eziokwu ụfọdụ na-eche banyere otú Chineke si agbaghara mmehie

 “Mmehie m karịrị akarị, Chineke agaghị agbaghara m.”

Chineke gbaghaara Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ

 Ọ bụrụhaala na anyị emee ihe Baịbụl kwuru ka anyị mee ma anyị mehie, Chineke ga-agbaghara anyị n’ihi na e nweghị mmehie ọ na-agaghị agbagharali. Ọ ga-agbagharali mmehie ndị dị oké njọ nakwa ndị e mere ugboro ugboro.​—Aịzaya 1:​18.

 Dị ka ihe atụ, Chineke gbaghaara Eze Devid mgbe ọ kwara iko, gbuokwa ọchụ. (2 Samuel 12:​7-​13) Pọl onyeozi chere na ọ bụ ya kacha bụrụ onye mmehie, ma a gbaghaara ya. (1 Timoti 1:​15, 16) Chineke tara ndị Juu ụta na ọ bụ ha gburu Jizọs, bụ́ Mesaya. Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụrụ na ha chegharịa, a ga-agbaghara ha.​—Ọrụ Ndịozi 3:​15, 19.

 “Ọ bụrụ na m kwupụtara ụkọchukwu ma ọ bụ onye ozi Chineke mmehie m, a kagbuola mmehie m.”

 E nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịgbaghara mmadụ ibe ya mmehie o mere megide Chineke. N’agbanyeghị na ịgwa onye ọzọ ihe anyị mejọrọ nwere ike inyere anyị aka mgbe anyị mehiere, ọ bụ naanị Chineke na-agbaghara mmehie.​—Ndị Efesọs 4:32; 1 Jọn 1:​7, 9.

 Ọ bụrụ otú ahụ, gịnị ka Jizọs bu n’obi mgbe ọ gwara ndịozi ya, sị: “Ọ bụrụ na unu agbaghara ndị ọ bụla mmehie ha, a gbagharawo ha mmehie ndị ahụ; ọ bụrụ na unu agbagharaghị mmehie nke ndị ọ bụla, a gbagharaghị ha”? (Jọn 20:23) Ihe Jizọs na-ekwu banyere ya bụ ike ọ ga-enye ndịozi ya mgbe ọ ga-enye ha mmụọ nsọ.​—Jọn 20:22.

 Dị ka o kwere ha ná nkwa, o nyere ndịozi ya onyinye a mgbe a wụkwasịrị ha mmụọ nsọ n’afọ 33 Oge Ndị Kraịst. (Ọrụ Ndịozi 2:1-4) Ọ bụ ya mere Pita onyeozi ji nwee ike ikpe Ananayas na Safaịra ikpe. Chineke mere ka Pita mata na ihe ha kwuru abụghị eziokwu, ikpe ọ mara ha gosikwara na a gaghị agbaghara ha mmehie ha.​—Ọrụ Ndịozi 5:​1-​11.

 Onyinye ahụ nakwa onyinye ndị ọzọ e si n’ike mmụọ nsọ nye ha, dị ka, ịgwọ ọrịa na ịsụ asụsụ ọzọ, kwụsịrị mgbe ndịozi Jizọs nwụchara. (1 Ndị Kọrịnt 13:​8-​10) N’ihi ya, e nweghị mmadụ ọ bụla nwere ike ịkagbu mmehie mmadụ ibe ya.