Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Kwuru Maka Pọgatrị?

Baịbụl Ò Kwuru Maka Pọgatrị?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba, o kwughị. Okwu ahụ bụ́ “pọgatrị” adịghị na Baịbụl. O nweghịkwanụ ebe o kwuru na mkpụrụ obi ndị nwụrụ anwụ na-aga ka a nụchaa ha na pọgatrị. a Ka anyị leba anya n’ihe Baịbụl kwuru banyere mmehie na ọnwụ nakwa otú o si dị iche n’ozizi pọgatrị.

  •   Ihe ga-asachapụ mmadụ mmehie bụ onye ahụ inwe okwukwe n’àjà mgbapụta Jizọs, ọ bụghị ịga n’ebe a na-akpọ pọgatrị. Baịbụl kwuru na “ọbara Jizọs bụ́ Ọkpara [Chineke] na-asachapụ anyị mmehie niile” nakwa na “Jizọs Kraịst . . . tọpụkwara anyị ná mmehie anyị site n’ọbara nke ya.” (1 Jọn 1:7; Mkpughe 1:5) Jizọs nyere “mkpụrụ obi ya ka ọ bụrụ ihe mgbapụta” maka mmehie ọtụtụ mmadụ.​—Matiu 20:28.

  •   Ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla. “Ndị dị ndụ maara na ha ga-anwụ; ma ndị nwụrụ anwụ amaghị ihe ọ bụla ma ọlị.” (Ekliziastis 9:5) Onye nwụrụ anwụ enweghị ike ịma ụfụ ihe, n’ihi ya o nweghị otú a ga-esi eji ọkụ pọgatrị mee ka ọ dị ọcha.

  •   O nweghị ahụhụ a na-ata onye nwụrụ anwụ maka mmehie ya. Baịbụl kwuru na “ụgwọ ọrụ nke mmehie na-akwụ bụ ọnwụ” kwuokwa na “a tọhapụwo onye nwụrụ anwụ ná mmehie ya.” (Ndị Rom 6:​7, 23) Ọnwụ bụ ụgwọ ọrụ na ntaramahụhụ zuru ezu maka mmehie.

a Akwụkwọ bụ́ Orpheus: A General History of Religions kwuru banyere pọgatrị na “o nweghị ihe ọ bụla e kwuru banyere ya n’oziọma Matiu, Mak, Luk na Jọn.” Akwụkwọ ọzọ bụ́ New Catholic Encyclopedia kwuru, sị: “E lebachaa anya n’ihe niile, ozizi pọgatrị ahụ chọọchị Katọlik na-akụzi gbadoro ụkwụ ná nkụzi ọdịbendị, ọ bụghị n’Akwụkwọ Nsọ.”​—Second Edition, Volume 11, peeji nke 825.

b Gụọ New Catholic Encyclopedia, Second Edition, Volume 11, peeji nke 824.