Gaa n'Isiokwu

Ònye ma Ọ Bụ Gịnị Bụ “Alfa na Omega”?

Ònye ma Ọ Bụ Gịnị Bụ “Alfa na Omega”?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọ bụ Jehova Chineke, Onye Pụrụ Ime Ihe Niile, ka a kpọrọ “Alfa na Omega.” Okwu a gbara ugboro atọ n’ime Baịbụl.—Mkpughe 1:8; 21:6; 22:13. a

Gịnị mere Chineke ji akpọ onwe ya “Alfa na Omega”?

 Alfa bụ mkpụrụ akwụkwọ edemede Grik nke mbụ, omega abụrụ nke ikpeazụ. Grik bụ asụsụ e ji dee akwụkwọ Baịbụl ndị a na-akpọ Agba Ọhụrụ, nke akwụkwọ Mkpughe so na ya. Ebe mkpụrụ akwụkwọ edemede Grik ndị a dị, ka e ji gosi na ọ bụ naanị Jehova bụ mmalite na ọgwụgwụ. (Mkpughe 21:6) Ọ bụ ya bụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile na mgbe ebighị ebi gara aga, ọ ga-anọgidekwa bụrụ Chineke Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ruo mgbe ebighi ebi. Ọ bụ naanị ya dị “site na mgbe ebighị ebi ruo mgbe ebighị ebi.”—Abụ Ọma 90:2.

Onye bụ onye “mbụ na onye ikpeazụ”?

 Ọ bụ ma Jehova Chineke ma Ọkpara ya bụ Jizọs ka Baịbụl kpọrọ “onye mbụ na onye ikpeazụ.” Ma, e nwere ihe dị iche ha pụtara ma a bịa n’onye nke a na-ekwu okwu ya. Tulee ihe atụ abụọ a.

  •   N’Aịzaya 44:6, Jehova kwuru, sị: “Abụ m onye mbụ, abụkwa m onye ikpeazụ, ọ dịghị Chineke ọzọ dịnụ ma e wezụga m.” N’ebe a, Jehova kwuru na ọ bụ ya bụ ezi Chineke nke na-adịru ebighi ebi, na e wezụga ya, e nweghị onye ọzọ. (Diuterọnọmi 4:35, 39) Na nke ugbu a, “onye mbụ na onye ikpeazụ” na “Alfa na Omega” pụtara otu ihe.

  •   Ma, “Onye Mbụ [pro’tos, ọ bụghị alfa] na Onye Ikpeazụ [e’skha·tos, ọ bụghị omega]” gbara ná Mkpughe 1:17, 18 na 2:8. Ihe ndị e kwuru n’amaokwu ndị a gosiri na onye a na-ekwu okwu ya nwụrụ ma si n’ọnwụ bilie. N’ihi ya, ọ gaghị abụ Chineke ka amaokwu ndị a na-ekwu gbasara ya, n’ihi na ọ dịbeghị mgbe Chineke nwụrụ anwụ. (Habakọk 1:12) Ma, Jizọs nwụrụ, e sikwa n’ọnwụ kpọlite ya. (Ọrụ Ndịozi 3:13-15) Ọ bụ mmadụ mbụ a kpọlitere n’ọnwụ ya agaa eluigwe bụrụ mmụọ na-anaghị anwụ anwụ. Ọ bụkwa ebe ahụ ka ọ ga-adị ndụ “ruo mgbe ebighị ebi.” (Mkpughe 1:18; Ndị Kọlọsi 1:18) Ọ bụzi Jizọs kpọliteziri ndị ọzọ niile nwụrụ anwụ. (Jọn 6:40, 44) N’ihi ya, ọ bụ onye ikpeazụ Jehova ji aka ya kpọlite n’ọnwụ. (Ọrụ Ndịozi 10:40) Ọ bụ na nke a ka ọ ga-ekwesị ekwesị ịkpọ Jizọs “Onye Mbụ na Onye Ikpeazụ.”

Mkpughe 22:13 ò gosiri na Jizọs bụ “Alfa na Omega”?

 Mba. E kwughị kpọmkwem onye kwuru ihe ahụ dị ná Mkpughe 22:13, e nwekwara ọtụtụ ndị kwuru okwu ná Mkpughe isi iri abụọ na abụọ. Mgbe Prọfesọ William Barclay na-ekwu gbasara Mkpughe isi iri abụọ na abụọ, o dere, sị: “E deghị ihe ndị a na-ekwu okwu ha n’usoro n’usoro; . . . o sikwara ike ịma kpọmkwem onye na-ekwu okwu.” (The Revelation of John, Mpịakọta nke 2, Nke E Degharịrị Edegharị, peeji nke 223) N’ihi ya, e nwere ike ikwu na onye a kpọrọ “Alfa na Omega” ná Mkpughe 22:13 bụ otu onye ahụ a kpọrọ “Alfa na Omega” n’ebe ndị ọzọ n’akwụkwọ Mkpughe, ya bụ, Jehova Chineke.

a Nke ugboro anọ ọ gbara bụ na Mkpughe 1:11 na Baịbụl King James Version. Ma, ọ dịghị n’ọtụtụ Baịbụl nke oge a n’ihi na ọ dịghị n’ihe odide Grik kacha ochie. Ma, ọ ga-abụ na e mechara tinye ya n’ụfọdụ Akwụkwọ Nsọ a sụgharịrị ọhụrụ.