Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ọ̀ Na-akụzi na ‘A Zọpụtahaala Mmadụ, A Zọpụtachaala Ya’?

Baịbụl Ọ̀ Na-akụzi na ‘A Zọpụtahaala Mmadụ, A Zọpụtachaala Ya’?

Ihe Baịbụl kwuru

 Mba. Baịbụl anaghị akụzi na ‘a zọpụtahaala mmadụ, a zọpụtachaala ya.’ Onye a zọpụtarala n’ihi na o nwere okwukwe na Jizọs Kraịst nwere ike kwụsị inwe okwukwe mezie ka a ghara ịzọpụta ya. Baịbụl kwuru na mmadụ kwesịrị ịgbasi mbo ike ma ọ bụ “lụsie ọgụ ike” ka okwukwe ya ghara ịnyụ ka ọkụ. (Jud 3, 5) A gwara Ndị Kraịst bụ́ ndị nabatarala Kraịst, sị: “Jirinụ egwu na ịma jijiji na-eme ihe ga-ewetara unu nzọpụta.”​—Ndị Filipaị 2:​12.

Amaokwu Baịbụl ndị gosiri na Baịbụl anaghị akụzi na ‘a zọpụtahaala mmadụ, a zọpụtachaala ya’

  •   Baịbụl gwara anyị ka anyị zere mmehie ndị ga-eme ka mmadụ ghara ịba n’Alaeze Chineke. (1 Ndị Kọrịnt 6:​9-​11; Ndị Galeshia 5:​19-​21) Ihe ahụ Baịbụl kwuru agaghị aba uru ma ọ bụrụ na e nweghị ihe ga-eme ka a ghara ịzọpụta mmadụ. Kama, Baịbụl gosiri na onye a zọpụtarala nwere ike ịlaghachi mewekwa mmehie dị oké njọ, a gharazie ịzopụta ya. Dị ka ihe atụ, Ndị Hibru 10:26 kwuru, sị: “Ọ bụrụ na anyị elezie anya na-eme mmehie mgbe anyị nwetasịrị ezi ihe ọmụma nke eziokwu ahụ, ọ dịkwaghị àjà ọ bụla fọrọ a ga-achụ maka mmehie.”​—Ndị Hibru 6:​4-6; 2 Pita 2:​20-​22.

  •   Jizọs ji ihe atụ banyere osisi vaịn na alaka ya mee ka o doo anya na anyị kwesịrị ịna-eme ka okwukwe anyị sie ike. O kwuru na ya bụ osisi vaịn, ndị na-eso ụzọ ya abụrụ alaka vaịn ahụ. Ụfọdụ n’ime ha ga-eji mkpụrụ ha na-amị ma ọ bụ àgwà ha gosi na ha nwere okwukwe na Jizọs. Ma e mechaa, ha ga-akwụsị inwe okwukwe. A ga-atụpụkwa ha dị ka alaka na-anaghị amị mkpụrụ, nke pụtara na a gaghịzi azọpụta ha. (Jọn 15:​1-6) Pọl onyeozi mekwara ụdị ihe atụ ahụ. O kwuru na ‘a ga-egbupụ’ Ndị Kraịst kwụsịrị inwe okwukwe.​—Ndị Rom 11:17-​22.

  •   E nyere Ndị Kraịst iwu ka ha ‘na-eche nche.’ (Matiu 24:42; 25:13) A gaghị azọpụta ndị na-ehi ụra ime mmụọ, ya bụ, ndị na-arụ “ọrụ ndị dịịrị ọchịchịrị” ma ọ bụ ndị na-anaghị eme ihe Jizọs nyere n’iwu.​—Ndị Rom 13:11-​13; Mkpughe 3:​1-3.

  •   Ọtụtụ amaokwu Baịbụl gosiri na ndị a zọpụtarala kwesịrị ịna-atachi obi, na-efekwa Chineke ruo ọgwụgwụ. (Matiu 24:13; Ndị Hibru 10:36; 12:​2, 3; Mkpughe 2:​10) Ndị Kraịst n’oge ochie nwere obi ụtọ mgbe ha nụrụ na ụmụnna ha ka na-atachi obi. (1 Ndị Tesalonaịka 1:2, 3; 3 Jọn 3, 4) Ọ bụrụ na a ga-azọpụta ndị na-atachighị obi ruo ọgwụgwụ, Baịbụl ọ̀ gaara ekwu na anyị kwesịrị ịnọgide na-atachi obi?

  •   Ọ bụ naanị mgbe Pọl onyeozi na-aga ịnwụ ka obi siri ya ike ikwu na a ga-azọpụta ya. (2 Timoti 4:​6-8) Tupu mgbe ahụ, ọ ma na ọ bụrụ na ya emewe ihe anụ ahụ́ ya chọrọ, a gaghị azọpụta ya. O dere, sị: “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá, na-achị ya dị ka ohu, ka m wee ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla, mgbe m kwusasịịrị ndị ọzọ ozi ọma.”​—1 Ndị Kọrịnt 9:​27; Ndị Filipaị 3:​12-​14.