Gaa n'Isiokwu

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?

Baịbụl Ò Kwuru Ka Anyị Na-agba Ista?

Ihe Baịbụl kwuru

 O nweghị ebe Baịbụl kwuru ka anyị na-agba Ista. Ị gụọ otú Ista si bido, ị ga-aghọta ihe Ista pụtara n’eziokwu. Ọ bụ ememme ndị oge ochie na-emere chi ọmụmụ ma ọ bụ chi na-eme ka ihe ha kọrọ n’ubi mee nke ọma. Lebagodị anya n’ihe ndị a.

  1.   Otú e si kpọwa ya Ista: Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica sịrị: “O nweghị onye ji n’aka ebe ndị Bekee si nweta aha a bụ́ Ista. Otu ụkọchukwu aha ya bụ Venerable Bede sịrị na ọ ga-abụ na e si n’aha chi nwaanyị a na-akpọ Istra nweta ya.” Ndị ọzọ na-ekwukwa na e si n’aha chi nwaanyị ndị Finishia a na-akpọ Astati nweta ya. Ha kweere na ọ bụ chi a na-enye nwa, na-emekwa ka ihe ha kọrọ n’ubi mee nke ọma. Ndị Babịlọn na-akpọ chi a Ishta.

  2.   Oké bekee e ji agba Ista: A na-ewere ya na oké bekee na-anọchi anya ọmụmụ. Akwụkwọ a na-akpọ Encyclopædia Britannica kwuru na ‘ebe ndị oge a si mụta iji oké bekee eme ememme Ista bụ n’aka ndị na-ekpeburu arụsị na Yurop na Ijipt na obodo ndị gbara ya gburugburu.’

  3.   Àkwá e ji agba Ista: Akwụkwọ a na-akpọ Funk & Wagnalls Standard Dictionary of Folklore, Mythology and Legend, kwuru na egwuregwu ụmụaka na-egwu, ya bụ, ịchọta àkwá Ista ndị e zoro ezo “abụghị egwuregwu nkịtị, kama na ọ bụ ihe a na-eme n’ememme ndị ọgọ mmụọ oge ochie.” Akwụkwọ ọzọ a na-akpọ Traditional Festivals kwuru na obodo ụfọdụ kweere na àkwá Ista ndị a chọrọ mma “nwere ike ime ka mmadụ nwewe obi ụtọ, ihe agawara onye ahụ nke ọma, ahụ́ esie ya ike, ihe ọjọọ agharakwa ime ya.”

  4.   Efe ọhụrụ a na-eyi n’oge Ista: Akwụkwọ a na-akpọ The Giant Book of Superstitions kwuru, sị: “E weere ya na mmadụ iyi efe ochie emere chi nwaanyị ndị Skandinevia a na-akpọ Istra ememme bụ mkparị, nakwa na o nwere ike ime ka ihe ọjọọ mee onye ahụ.”

 Akwụkwọ a na-akpọ The American Book of Days kwuru hoo haa otú Ista si bido. Ọ sịrị: “O doro ewu na ọkụkọ anya na ndị mbụ kpere chọọchị webatara ememme ndị ọgọ mmụọ na chọọchị, mezie ya ka o yie ememme Ndị Kraịst.”

 Baịbụl sịrị ka anyị ghara ịnwa anwa jiri omenala ndị Chineke kpọrọ asị na-efe ya. (Mak 7:6-8) 2 Ndị Kọrịnt 6:17 kwuru, sị, “‘Kewapụnụ onwe unu,’ ka Jehova sịrị, ‘kwụsịkwanụ imetụ ihe na-adịghị ọcha aka.’” Ememme Ista bụ ememme ndị ọgọ mmụọ. N’ihi ya, ndị niile chọrọ ime ihe Chineke na-achọ ekwesịghị ịna-eme ya.