Gaa n'Isiokwu

Ọ̀ Bụ Echiche Mmadụ Ka E Dere na Baịbụl?

Ọ̀ Bụ Echiche Mmadụ Ka E Dere na Baịbụl?

Ihe Baịbụl kwuru

 Ọ bụ eziokwu na e nwere ọtụtụ okwu amamihe ndị e dere na Baịbụl, Baịbụl kwuru na “Akwụkwọ Nsọ dum si n’ike mmụọ nsọ Chineke.” (2 Timoti 3:16) E nwere ọtụtụ ihe mere anyị ga-eji kweta na Baịbụl si n’ike mmụọ nsọ Chineke. Legodị ụfọdụ n’ime ha:

  •   O nwebeghị onye kwuru na ihe a kọrọ na Baịbụl emeghị eme, e mechaa ihe ahụ onye ahụ kwuru abụrụ eziokwu.

  •   Ndị dere Baịbụl ezochighị ihe ha mere. Otú ha si kwuo ihe niile hoo haa gosiri na ha kwuru eziokwu.

  •   Baịbụl n’ozuzu ya na-ekwu na ọ bụ Chineke kwesịrị ịchị ụmụ mmadụ nakwa na uche ya ga-emecha mee n’ụwa mgbe Alaeze ya ga-esi n’eluigwe chịwa ụwa.

  •   Ọ bụ eziokwu na o ruola ọtụtụ puku afọ e dere Baịbụl, ma ị gụwa ya, ị gaghị agụta ihe ndị na-abụghị eziokwu ndị sayensị kwuru n’oge gara aga.

  •   Ihe ndị mgbe ochie dere gosiri na amụma ndị e buru na Baịbụl mechara mezuo.